Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 5:15 - Bible Nso

15 O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n'iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n'uwa nile, ọ bu nání n'Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n'aka orù-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Mgbe ahụ, Neeman na ndị niile ya na ha so laghachikwutere onye nke Chineke. O guzoro nʼihu ya sị, “Ugbu a amatala m na ọ dịghị Chineke ọzọ dị nʼụwa niile ma ọ bụghị naanị nʼIzrel. Ya mere, biko, nara onyinye a site nʼaka ohu gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 5:15
25 Iomraidhean Croise  

Biko, nara ngọzim nke ewetaworo gi; n'ihi na Chineke emewom amara, na n'ihi na enwerem ihe nile. O rugide ya, ọ we nara ya.


Eze we si onye nke Chineke ahu, Sorom ba n'ulo, b͕a onwe-gi ume, m'gēnye kwa gi onyinye.


O rue, na mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma, na Elaija, bú onye-amuma, biaruru nso, si, Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka amara ta na Gi onwe-gi bu Chineke n'Israel, na mu onwem bu kwa orù-Gi, na ọ bu kwa n'okwu-Gi ka m'meworo ihe nile ndia.


Hezekaia we kpe ekpere n'iru Jehova, si, Jehova, bú Chineke Israel, Onye nēbi n'etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa.


Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, biko, zọputa ayi n'aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke, nání Gi.


O rue, mb͕e Elaisha bú onye nke Chineke, nuru na eze Israel dọwara uwe-ya nile, o we zigara eze ozi, si, N'ìhi gini ka i dọwara uwe-gi nile? biko, ka ọ biakutem, ọ gāmara kwa na onye-amuma di n'Israel.


Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem.


Unu atula oké egwu, unu ama-kwa-la jijiji: ọ̀ bughi site na mb͕e gara aga ka M'meworo ka i nuru, gosi kwa gi ya? unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm. Ọ̀ di Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem? é-è, ọ dighi Oké Nkume ọ bula di; ọ dighi otù efu M'mara.


ka ha we mara site n'ọwuwa anyanwu, site kwa n'Ọdida-anyanwu, na ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli ma ewezuga náním: Mu onwem bu Jehova, ọ dighi kwa onye ọzọ di.


Eze zara Daniel, si, N'ezi-okwu Chineke-unu bu Chineke nke chi nile, na Onye-nwe ndi-eze, na Onye nēkpughe ihe-nzuzo nile, ebe i puru ikpughe ihe-nzuzo a.


N'ihi ya anēsite n'akam nye iwu, si, na ndi ọ bula, ma-ọbu mba ọ bula, ma-ọbu asusu ọ bula, nke gēkwuhie megide Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego, agābọkasi ya, ọ bu kwa ulo-ya ka agēme ebe-ikpofu-ahihia: n'ihi na ọ dighi chi ọzọ nke puru inaputa otú a.


Ma n'ọgwugwu ubọchi ahu nile mu onwem, bú Nebukadneza, weliri anyam abua lekwasi elu-igwe, ihe-ọmumam we laghachikutem, ọ bu kwa Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka m'gọziri, ọ bu kwa Onye ahu nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi ka m'jara sọpuru kwa, Onye ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, ala-eze-Ya nādigide kwa n'ọb͕ọ nile:


n'ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa.


Ya mere agurughi m na ọ di nkpà iriọ umu-nna-ayi, ka ha buru uzọ jekuru unu, buru kwa uzọ me ka ihe-ngọzi ahu nke unu buru uzọ kwe na nkwa zu okè, ka ihe ahu we buru ihe edoziri, dika ihe-ngọzi, ọ bughi kwa dika ihe-nrib͕u.


Ha we za Joshua, si, N'ihi na egosiri ndi-orù-gi n'ezie na Jehova, bú Chineke-gi, nyere Moses, bú orù-Ya, iwu inye unu ala nka nile, na ikpochapu ndi nile bi n'ala nka n'iru unu; ayi we tua egwu nke-uku bayere ndu-ayi n'ihi unu, ayi we me ihe a.


Ha we si ya, Ala di anya nke-uku ka ndi-orù-gi si bia n'ihi aha Jehova, bú Chineke-gi: n'ihi na ayi anuwo akukọ- Ya, na ihe nile O mere n'Ijipt,


Ma ub͕u a ngọzi a nke nwayi nējere gi ozi wetaworo onye-nwem, ka enye ya umu-okorọbia ndi nēso onye-nwem n'ukwu n'ukwu jeghari.


Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Ma, le, ọ buru na ayi eje, gini ka ayi gēji bakuru nwoke ahu? n'ihi na achicha alapuwo n'ihe-ayi, ọ dighi kwa onyinye iji bakuru onye nke Chineke: gini di n'aka-ayi?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan