Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 4:40 - Bible Nso

40 Ha we wuputara ndikom ahu, ka ha rie. O rue, mb͕e ha nēri ofé ahu, na ndi ahu tiri nkpu, si, Ọnwu di n'ite, gi onye nke Chineke. Ha apughi kwa iri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

40 Mgbe o ghere, a wụpụtara ya nye ndị ikom ndị ahụ. Ma mgbe ha bidoro iri ya, ha tiri mkpu akwa sị, “Onye nke Chineke, lee, ọnwụ dị nʼite nri a.” Ha enwekwaghị ike iri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 4:40
11 Iomraidhean Croise  

Jekob we sie ofé: Isọ we si n'ọhia bata, ya onwe-ya nāda kwa #mbà:


Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua?


O we ziga-kwa-ra ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ọzọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Ọ za, si ya, Onye nke Chineke, otú a ka eze siworo, Ngwa ngwa, ridata.


Ọ we ziga kwa onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri nke-atọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia b͕ue ikperè-ya n'ala n'iru Elaija, riọ ya amara, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum, na ndu ọgu ndi-orù-gi abua na iri ndia, di oké ọnu-ahia n'anya-gi.


O we zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. O we rigokuru ya: ma, le, ọ nānọdu n'elu ugwu. O we gwa ya okwu, si, Gi onye nke Chineke, Eze asiwo, Ridata.


Otù onye we pua ba n'ọhia ichikọta akwukwọ nri, ọ huta osisi vine ọhia, chikọta afufa-ọhia nime ya nju uwe-ya, bia, biye ha n'ite ofé: n'ihi na ha amaghi ha.


Nwayi ahu we si di-ya, Biko, le, amawom na onye di nsọ nke Chineke ka ọ bu, bú onye a nagabiga n'akuku ayi mb͕e nile.


Ma ub͕u a, biko, gbaghara nmehiem nání otù ub͕ò a, riọ-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, ka Ọ we wezuga n'arum nání ọnwu a.


Ha we biarue Mara, ma ha apughi iṅu miri nke Mara, n'ihi na ilu ka ha di: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Mara.


ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha aṅua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gaghi emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike.


Nka bu kwa ngọzi ahu, nke Moses, bú onye nke Chineke, gọziri umu Israel tutu ọnwu-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan