Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 4:27 - Bible Nso

27 O we biakute onye nke Chineke rue ugwu ahu, jide ya n'ukwu-ya abua. Gihezi we biarue nso inupu ya; ma onye nke Chineke siri, Ra ya aka: n'ihi na nkpuru-obi-ya di ilu nime ya; ma Jehova ezonariwom ya, O gosighkwam ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ma mgbe ọ bịakwutere onye nke Chineke, ọ dara nʼala nʼihu ya, jide ya nʼụkwụ ya abụọ. Gehazi bịaruru nso inupu ya, ma onyeozi Chineke sịrị ya, “Hapụ ya aka, nʼihi na ọ dị ihe na-enye ya nsogbu nʼime mmụọ ya, ma Onyenwe anyị zonarịrị m ya, ọ gwaghịkwa m ihe mere.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 4:27
19 Iomraidhean Croise  

Jehova we si, Mu onwem, M'nēzonari Abraham ihe Mu onwem nēme;


Netan we si eze, Ihe nile nke di n'obi-gi, je, me ya; n'ihi na Jehova nọyere gi.


O we je, biakute onye nke Chineke ahu, rue ugwu Kamel. O rue, mb͕e onye nke Chineke huru ya site na ncherita-iru ya, na ọ siri Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Le, nwayi Shunem ahu:


biko, b͕a ọsọ izute ya ub͕u a, si ya, Ì nọ n'udo? di-gi, ọ̀ nọ n'udo? nwa-gi, ọ̀ nọ n'udo? Ọ si, Ayi nọ n'udo.


Otù onye nime ndi-orù-ya we si, É-è, onye-nwem eze: kama Elaisha, bú onye-amuma nke nọ n'Israel, o nēgosi eze Israel okwu nile nke i nēkwu n'ime-ulo-ndina-gi.


Ike ndum agwuwo nkpuru-obim; Ka m'rapuru onwem ntamum; Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.


Obi mara ilu nke aka ya; Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya.


Mọ madu gānagide ọria-ya; Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u, ònye gēburu ya?


N'ezie Onye-nwe-ayi Jehova agaghi-eme ihe, ma ọ buru na O kpugheghi ìzù nzuzo Ya nye ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma-Ya.


Ma Ọ zaghi ya okwu ọ bula. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, nēkpere Ya, si, Zilaga ya; n'ihi na ọ nētiso ayi nkpu.


Ìgwè madu ahu we bara ha nba, ka ha kpuchie ọnu-ha: ma ha tikariri nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.


Ma le, Jisus zutere ha, si, Ṅurianu ọṅu. Ha we bia jide ukwu-Ya abua, kpọ isi ala nye Ya.


Ha we kutara Ya umu-ntakiri, ka O we metu ha aka: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba.


Ma Jisus siri, Rapunu ya; gini mere unu nēsob͕u ya? ọ luru ọlu ọma n'arum.


we guzo n'azu n'ukwu-Ya, nākwa ákwá, we malite iwere anya-miri-ya desa ukwu-Ya abua, o were kwa agiri-isi-ya hicha ha, o we sutu ukwu-Ya ọnu nke-uku, were manu-otite ahu te ha.


Akpọkwaghm unu ndi-orù ọzọ site n'ub͕u a; n'ihi na orù adighi-amara ihe onye-nwe-ya nēme: ma akpọwom unu ndi-eyì; n'ihi na ihe nile M'nuru site n'ọnu Nnam ka M'mere ka unu mara.


Mb͕e Ọ nēkwu nka ndi nēso uzọ-Ya biara; o we ju ha anya na Ya na nwanyi nēkwurita okwu: otú ọ di, o nweghi onye ọ bula siri, Gini ka I nāchọ? ma-ọbu, Gini mere Gi na ya nēkwurita okwu?


O we di Hana ilu na nkpuru-obi, o we kpere Jehova, kwasie ákwá ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan