Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 4:26 - Bible Nso

26 biko, b͕a ọsọ izute ya ub͕u a, si ya, Ì nọ n'udo? di-gi, ọ̀ nọ n'udo? nwa-gi, ọ̀ nọ n'udo? Ọ si, Ayi nọ n'udo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Gbara ọsọ gaa zute ya jụọ ya sị ya, ‘Ọ dịkwa mma? Dị gị ọ nọkwa nʼudo? Nwa gị ọ nọkwa nʼudo?’ ” Mgbe Gehazi zutere ya jụọ ajụjụ ndị a, nwanyị ahụ zara Gehazi sị ya, “E, anyị niile nọ nʼudo, ihe niile na-aga nke ọma.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 4:26
16 Iomraidhean Croise  

Ọ si ha, Ọ̀ nọ n'udo? Ha si, Ọ nọ n'udo: ma, le, Rechel, bú nwa-ya nwayi, nābia, ya na ìgwè ewu na aturu-ya.


Ọ si ya, Biko, je le ma umu-nne-gi nọ n'udo, ma ìgwè ewu na aturu di kwa n'udo; weghachikwaram okwu. O si na ndagwurugwu Hebron ziga ya, o we biarue Shekem.


Ọ jua ha ajuju bayere udo-ha, si, Ọ̀ nọ n'udo, bú nna-unu, agadi ahu onye unu kwuru okwu bayere ya? Ọ̀ nọ kwa ndu?


Eze we si, Ùdo diri nwa-okorọbia ahu, bú Absalom: Ahimaaz we si, Ahurum oké ìgwè madu mb͕e Joab zitere orú eze na orù-gi, ma amaghm ihe ọ bu.


Ọ si, Gini mere gi onwe-gi nējekuru ya ta? ọ bughi ọnwa ọhu, ọ bughi kwa ubọchi-izu-ike. Ọ si, Udo.


O we je, biakute onye nke Chineke ahu, rue ugwu Kamel. O rue, mb͕e onye nke Chineke huru ya site na ncherita-iru ya, na ọ siri Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Le, nwayi Shunem ahu:


O we biakute onye nke Chineke rue ugwu ahu, jide ya n'ukwu-ya abua. Gihezi we biarue nso inupu ya; ma onye nke Chineke siri, Ra ya aka: n'ihi na nkpuru-obi-ya di ilu nime ya; ma Jehova ezonariwom ya, O gosighkwam ya.


Ọ si, Udo di. Onye-nwem ezitewom, si, Le, ọbuná ub͕u a umu-okorọbia abua nime umu ndi-amuma esiwo n'ugwu Efraim biakutem; biko, nye ha otù talent ọla-ọcha, na uwe nb͕anwe abua.


Aghọrọm onye-ob͕i, adighm-asaghe ọnum; N'ihi na Gi onwe-gi mere ya.


Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N'aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n'iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti.


si ya, B͕a ọsọ, gwa nwa-okorọbia nka okwu, si, N'obodo di iche iche nēnweghi mb͕idi ka Jerusalem gēbi, site n'iba-uba madu na anumanu di nime ya.


Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Pọl we si Banabas, Ka ayi jeghachi ub͕u a leta umu-nna-ayi n'obodo nile n'otù n'otù ebe ayi kwusara okwu Onye-nwe-ayi, ka ayi we le otú ha nēme.


buga-kwa-ra onye-isi usu nnù ndikom na ọgu ise nke ha cheese iri ndia, lekọta kwa umu-nne-gi ma ha nọ n'udo, nara kwa ihe-mbe-ha.


Samuel we gosi ya okwu ahu nile, ọ dighi kwa ihe o zonariri ya. O we si, Jehova ka ọ bu: Ya me ihe di nma n'anya-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan