Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 4:25 - Bible Nso

25 O we je, biakute onye nke Chineke ahu, rue ugwu Kamel. O rue, mb͕e onye nke Chineke huru ya site na ncherita-iru ya, na ọ siri Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Le, nwayi Shunem ahu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Ya mere, o buliri ije, gakwuru onye nke Chineke nʼugwu Kamel. Mgbe o lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, onye nke Chineke sịrị odibo ya bụ Gehazi, “Lee nwanyị Shunem ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 4:25
10 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a ziga, chikọtaram Israel nile rue ugwu Kamel, na ndi-amuma Beal, ndi di nnù madu na ọgu abua na iri, na ndi-amuma Ashera, ndi di nnù madu, ndi nēri ihe na table Jezebel.


Ehab we rigo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu. Ma Elaija rigoro n'elu ugwu Kamel; o ruru ala, tiye iru-ya n'etiti ikperè-ya abua.


O we zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. O we rigokuru ya: ma, le, ọ nānọdu n'elu ugwu. O we gwa ya okwu, si, Gi onye nke Chineke, Eze asiwo, Ridata.


O si n'ebe ahu jerue ugwu Kamel, si kwa n'ebe ahu laghachi na Sameria.


O we jikwa inyinya-ibu, si nwa-okorọbia-ya, Nēdu, nēje kwa; eb͕ochilaram inyinya-ibu n'ibum b͕a ọsọ, ma ọ buru na asighm i.


biko, b͕a ọsọ izute ya ub͕u a, si ya, Ì nọ n'udo? di-gi, ọ̀ nọ n'udo? nwa-gi, ọ̀ nọ n'udo? Ọ si, Ayi nọ n'udo.


O we biakute onye nke Chineke rue ugwu ahu, jide ya n'ukwu-ya abua. Gihezi we biarue nso inupu ya; ma onye nke Chineke siri, Ra ya aka: n'ihi na nkpuru-obi-ya di ilu nime ya; ma Jehova ezonariwom ya, O gosighkwam ya.


Ma Gihezi, bú nwa-okorọbia Elaisha onye nke Chineke, siri, Le, onye-nwem eb͕ochiwo onwe-ya n'ebe Neaman onye Siria nka nọ, n'ighara inara n'aka-ya ihe o wetara: Jehova nādi ndu, n'ezie m'gāb͕aso ya, nara ihe ufọdu n'aka-ya.


Ma eze nāgwa Gihezi, bú nwa-okorọbia onye nke Chineke, okwu, si, Biko, kọrọm akukọ ihe uku nile nke Elaisha meworo.


Ọ gāb͕awa nke-uku, teghari kwa egwú ọṅù, e, n'iteghari-egwú-ọṅù na n'iti-nkpu-ọṅù; nsọpuru Lebanon ka agēnye ya, e, ima-nma nke Kamel na Sheron: ndia gāhu ebube Jehova, bú ima-nma nke Chineke-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan