O je kwa, zigara Jehoshafat, bú eze Juda, ozi, si, Eze Moab ejehiewo megidem: ì gēsorom jekuru Moab ibu agha? Ọ si, M'gārigo: dika m'di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di.
Eze Israel we je, ya na eze Juda, na eze Edom: ha we ga ije ubọchi asa buruburu: ma ọ dighi miri diri ọmuma-ulo-ikwū ahu, ma ọbu nke diri anu-ulo nke ha chiri je.