Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 3:3 - Bible Nso

3 Otú ọ di, ọ rapara na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie; o wezugaghi onwe-ya nime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Otu ọ dị, ọ nọgidere na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel baa nʼime mmehie ife arụsị. Joram esiteghị na ha wezuga onwe ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 3:3
20 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ihe a gasiri, Jeroboam esighi n'uzọ ọjọ ya laghachi, ma o me-kwa-ra ndi-nchu-àjà nke ebe di elu ọzọ site n'ọnu-ọgugu nile nke ndi Israel: onye ihe-ya nātọ ya utọ, o mejue ya aka, o we ghọ otù nime ndi-nchu-àjà nke ebe di elu.


Ọ gārara kwa Israel nye n'ihi nmehie Jeroboam nile, nke o mehieworo, na nke o ji me ka Israel mehie.


ma i mewo ihe ọjọ kari ndi nile buru gi uzọ, i we je mere onwe-gi chi ọzọ di iche iche, na arusi a kpuru akpu, ikpasum iwe, i we tufuem n'azu gi:


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ nna-ya, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie.


O rue, dika agāsi na ọ bu ihe nfe na ọ nējeghari na nmehie nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na ọ luru Jezebel na nwunye, bú nwa-nwayi Etbeal eze ndi Zaidon, ọ we je fè Beal òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ya.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, bú nke o jiri me ka Israel mehie, wezuga onwe-ya: kama o jeghariri nime ya.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, jeso nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie; o sighi nime ya wezuga onwe-ya.


Otú ọ di, ha esighi na nmehie nile nke ulo Jeroboam wezuga onwe-ha, bú nke o jiri me Israel ka ha mehie, ma Jehoahaz nējeghari nime ya: ọzọ kwa, Ashera guzoro na Sameria.)


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya ubọchi-ya nile, bú nmehie o jiri me ka Israel mehie.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova dika nna-ya-hà mere: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie.


N'ihi na Ọ dọwapuru Israel n'ulo Devid; ha we me Jeroboam nwa Nebat eze: Jeroboam we chuputa Israel n'iso Jehova, o we me ka ha mehie nmehie uku.


Umu Israel we jegharia nime nmehie nile nke Jeroboam, nke o mere; ha esighi nime ha wezuga onwe-ha;


rue mb͕e Jehova siri n'iru Ya wezuga Israel, dika O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma. Ewe me ka Israel si n'elu ala-ha je biri n'Asiria, rue ta.


Ọzọ kwa, Manase wusiri ọbara nke-uku ri nne, bú nke nēmeghi ihe ọjọ, rue mb͕e o mejuru Jerusalem site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ; nāgughi nmehie-ya nke o jiri me ka Juda mehie, ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


Ọzọ kwa, ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, na ebe di elu nke Jeroboam nwa Nebat mere, bú onye mere ka Israel mehie, ọbuná ebe-ichu-àjà ahu na ebe ahu di elu ka ọ kwaturu; o sure ebe ahu di elu ọku, supia ya me ka ọ ghọ uzuzu, sure kwa Ashera ọku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan