Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 3:23 - Bible Nso

23 ha we si, Nka bu ọbara; ekpochapuwo ndi-eze ahu nọ̄, ha etib͕uwo kwa, nwoke ọ bula ibe-ya: ma ub͕u a, Moab, kwatanu ihe-nkwata.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Mgbe ahụ, ha sịrịtara onwe ha, “Leenụ ọbara! Ọ ga-abụ na ndị agha eze atọ ndị a etigbuola onwe ha. Pụtanụ, unu ndị Moab, ka anyị gaa kwakọrọ ihe nkwata na-agha!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 3:23
8 Iomraidhean Croise  

Ha we bilie n'isi-ututu, ma anyanwu mukwasiri miri ahu, Moab we hu miri ahu na ncherita-iru ha ka ọ nācha ọbara dika ọbara:


Ha biarue ọmuma-ulo-ikwū Israel, Israel we bilie, tib͕ue Moab, ha we si n'iru ha b͕alaga: ha we ba nime ya nētib͕u Moab.


N'ihi na Onwe-nwe-ayi mere ọmuma-ulo-ikwū Siria ka ha nu olu ub͕ọ-ala, na olu inyinya, bú olu oké usu-ndi-agha: ha we sirita onwe-ha, Le, eze Israel egowo ndi-eze ndi Het, na ndi-eze Ijipt, imegide ayi, ibiakwasi ayi.


Jehoshafat na ndi-ya we bia iluta ihe-nkwata-ha n'agha, ha we hu n'etiti ha ma àkù ma ozu ma ihe di oké ọnu-ahia n'uba, ha we napusia onwe-ha ihe, kari nke ha nwere ike ibū: ha we nọ ubọchi atọ nāluta ihe-nkwata n'agha, n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu.


Onye-iro siri, M'gāchu, m'gēru ha aru, m'gēkesa ihe m'kwatara: Nkpuru-obim gējuputa na ha, M'gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile.


akam achọtawo kwa àkù ndi nile di che iche dika akwu; na dika madu si achikọta àkwá arapuru arapu, otú a uwa nile ka mu onwem chikọtaworo: ma ọ dighi nke nēmeghari nkù, ma-ọbu nke nāsaghe ọnu, ma-ọbu nke nēbe ebe.


Hà achọtaghi? hà ekèghi ihe-nkwata? Otù nwa-ab͕ọghọ, umu-ab͕ọghọ abua, gādiri nwoke ọ bula, n'isi n'isi; Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji, diri Sisera, Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma, Bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma n'akuku abua, nke diri olu ndi akwatara?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan