Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 3:19 - Bible Nso

19 Unu gētib͕u kwa obodo ọ bula ewusiri ike, na obodo ọ bula kachasi nma, unu gēme kwa ka ezi osisi ọ bula da, unu gēkpochi kwa isi-iyi miri nile, were kwa nkume mebie ezi òkè ala-ubi ọ bula.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Unu ga-etigbu obodo ọbụla e wusiri ike, na obodo ukwu niile. Unu ga-egbudakwa ezi osisi ha na-amị mkpụrụ, kpọchie isi mmiri ha niile, werekwa nkume mebikwaa ezi ala ubi ha niile.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 3:19
8 Iomraidhean Croise  

Chineke we meghe anya-ya abua, ọ hu olùlù-miri; ọ we je, b͕ajue karama-akpukpọ-ya na miri, me ka nwa-okoro ahu ṅua.


Ọ si, Meghe window n'akuku Iru-anyanwu: o we meghe. Elaisha we si, B͕a: o we b͕a. Ọ si, Àkú nzọputa Jehova nwere, bú àkú nzọputa imegide Siria: i gētib͕u kwa Siria n'Efek, rue mb͕e i gēme ka ha gwusia.


Ha we tipia obodo nile ha; ha nātubà kwa, nwoke ọ bula nkume-ya, n'ezi òkè ala-ubi ọ bula, tujue ya; ha nēkpochi kwa isi-iyi miri nile, me ka ezi osisi nile da: rue mb͕e ọ bu nání na Kia-hareset ka emere ka nkume-ya fọdu; ma ndi-ọma-èbè b͕ara ya buruburu, tib͕ue ya.


Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a: Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso: Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije, Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie, We mapue akuku nile nke Moab, Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,


Jehova we si ya, N'ihi na Mu na gi gānọ, i gētib͕u kwa Midian dika otù nwoke.


Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.


Devid we jua Jehova ase, si, M'gēje tib͕ue ndi Filistia ndia? Jehova we si Devid, Je, tib͕ue ndi Filistia, zọputa Keila.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan