Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 3:15 - Bible Nso

15 Ma ub͕u a kutaranum ọkpọ-ubọ. O rue, mb͕e ọkpọ-ubọ ahu nākpọ, na aka Jehova di n'aru ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ma ugbu a, kpọtaranụ m onye na-akpọ ụbọ.” Mgbe ọkpọ ụbọ ahụ malitere ịkpọ ụbọ ya, aka Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaisha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 3:15
14 Iomraidhean Croise  

Aka Jehova we di n'aru Elaija; o we ke ihe-ọkiké n'úkwù-ya, b͕a ọsọ n'iru Ehab, rue ebe i nābà Jezreel.


Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Me ndagwurugwu a ka ọ buru olùlù olùlù.


M'gātọ ntim n'ala n'ilu: M'gēkpughepu okwu-omimim n'ubọ-akwara.


okwu Jehova ruru Ezikiel nwa Buzi, bú onye-nchu-àjà, nti n'ezie n'ala ndi Kaldea, n'akuku osimiri Keba; aka Jehova we di ya n'aru n'ebe ahu.


Mọ Chineke we buliem, bupum: m'we jegharia n'ilu obi, n'ọnuma nke mọm, ọzọ, aka Jehova nke di n'arum di ike.


Aka Jehova we dim n'aru n'ebe ahu; O we sim, Bilie, pua, jerue ndagwurugwu, n'ebe ahu ka M'gākpayere gi uka.


O rue, n'arọ nke-isi, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nānọdu ala n'ulom, mb͕e ndi-okenye Juda nānọdu kwa ala n'irum, na aka Onye-nwe-ayi Jehova dakwasirim n'ebe ahu.


Aka Onye-nwe-ayi we so ha: oké ìgwè ndi kwere we chigharikute Onye-nwe-ayi.


Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n'ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n'ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n'iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma:


Biko, ka onye-nwe-ayi si ndi-orù-ya, ndi nọ n'iru gi, ka ha chọ nwoke nke mara ọkpukpọ-ubọ-akwara nke-ọma: ọ gēru kwa, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke dikwasi n'aru gi, na ọ gēwere aka-ya kpọ ubọ, ọ gādi kwa gi nma.


O rue, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke di n'aru Sọl, na Devid were ubọ-akwara-ya, were aka-ya kpọ ya: aru we dajua Sọl, o we di ya nma, mọ ọjọ ahu we si n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya.


O rue, n'echi-ya, na mọ ọjọ nke Chineke dakwasiri Sọl n'ike, o we bū amuma n'etiti ulo: Devid nēwere kwa aka-ya kpọ ubọ, dika ọ nēme kwa-ubọchi: ma ube di n'aka Sọl.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan