Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 3:11 - Bible Nso

11 Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ ebe a, ka ayi we jua Jehova ase site n'aka-ya? Otù nime ndi-orù eze Israel we za, si, Elaisha nwa Shefat nọ ebe a, onye wukwasiri miri n'aka Elaija.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ma Jehoshafat, eze Juda, jụrụ ajụjụ sị, “Ọ bụ na o nweghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị ga-esi nʼaka ya jụta Onyenwe anyị ase, site na ya?” Otu onyeisi agha ndị Izrel sị ha, “Ịlaisha, nwa Shafat, onye jeere Ịlaịja ozi, nọ nʼebe a.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 3:11
27 Iomraidhean Croise  

biko, ka ekute nwantī miri, unu sa ukwu-unu, zuru-kwa-nu ike n'okpuru osisi a:


O we si n'iso ya laghachi, were ehi abua ahu ejikọrọ n'otù, b͕ue ha, o were kwa ihe ehi ahu ji alu ọlu sie anu-ha, o nye ndi ahu, ha rie. O bilie, jeso Elaija, we jere ya ozi.


Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ n'ebe a tiyere ndia, ka ayi we jua ase n'aka-ya?


O si n'ebe ahu jerue ugwu Kamel, si kwa n'ebe ahu laghachi na Sameria.


Eze Israel we si, Ewó! n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab.


Jehoshafat we si, Okwu Jehova di n'ebe ọ nọ. Eze Israel na Jehoshafat na eze Edom we ridakuru ya.


Otú ọ di, ọ rapara na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie; o wezugaghi onwe-ya nime ya.


Sọl we nwua n'ihi nmekpu-ya o mekpuru megide Jehova, n'ihi okwu Jehova, nke ọ nēdebegh: ọzọ kwa, n'ihi na ọ juru ase n'aka onye nwere mọ ọ nāju ihe, iji ya ju ase,


Devid we jua Chineke ase, si, M'gārigo imegide ndi Filistia? Ì gēnye kwa ha n'akam? Jehova we si ya, Rigo; M'gēnye kwa ha n'aka-gi.


Devid we jua Chineke ase ọzọ; Chineke we si ya, Arigola iso ha: si n'ebe ha nọ ga buruburu, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam.


N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu būru ya na mbu, n'ihi ya ka Jehova, bú Chineke-ayi, tiwaputara megide ayi, n'ihi na ayi achọghi Ya dika ikpé-Ya si di.


Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ n'ebe a tiyere ndia, ka ayi we jua ase n'aka-ya?


Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi: Ọ dighi onye-amuma di ọzọ; Ọ dighi kwa onye nọ n'etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru.


eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n'ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N'aka eze Babilon ka agēnye gi.


N'ezie Onye-nwe-ayi Jehova agaghi-eme ihe, ma ọ buru na O kpugheghi ìzù nzuzo Ya nye ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma-Ya.


Ma unu mara ọnwunwa-ya, na, dika nwa nēso nna-ya, otú a ka o sorom buru orù n'izisa ozi ọma.


onye anāb͕ara ya ezi àmà n'ọlu ọma; ọ buru na ọ zùputawo umu, ọ buru na o lewo ndi-ọbìa anya nke-ọma, ọ buru na ọ sawo ukwu ndi nsọ, ọ buru na o b͕owo nkpà ndi anākpab͕u, ọ buru na o sosiwo ezi ọlu nile ọ bula ike.


O rue, mb͕e ọnwu Moses, bú orù Jehova, gasiri, na Jehova gwara Joshua nwa Nun, bú onye nējere Moses ozi, okwu, si,


Ndikom ahu we nara ufọdu nime ihe-oriri-uzọ-ha, ha ajughi kwa ase n'ọnu Jehova.


Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ.


(Umu Israel we rigo, kwa ákwá n'iru Jehova rue anyasi; ha we jua Jehova ase, si, M'gābiaru kwa nso ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha? Jehova we si, Rigonu megide ya.)


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan