Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 23:8 - Bible Nso

8 O me-kwa-ra ka ndi-nchu-àjà nile si n'obodo Juda nile bia, o meru-kwa-ra ebe nile di elu ebe ndi-nchu-àjà surere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, site na Geba rue Bia-sheba; ọ kwatu-kwa-ra ebe nile di elu nke ọnu-uzọ-ama nke di n'oghere ọnu-uzọ-ama Joshua, bú onye-isi obodo, nke di n'aka-ekpe madu n'ọnu-uzọ-ama obodo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 O mere ka ndị nchụaja niile site nʼobodo Juda niile bịa, o merụkwara ebe ịchụ aja niile nke dị elu, site na Geba ruo Bịasheba, ebe ndị nchụaja ndị a nọrọ suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ọ kwatụrụ ọnụ ụzọ ama nke dị nʼebe ọnụ ụzọ ama Joshua, onye bụ gọvanọ obodo, nke dị nʼakụkụ aka ekpe nke ọnụ ụzọ ama obodo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 23:8
13 Iomraidhean Croise  

Abraham we bilie n'isi-ututu, were achicha na karama-akpukpọ miri nye Hega, tukwasi ya n'ubu-ya, ọ nye kwa ya nwa-ya, zilaga ya: ọ we je, nāwaghari n'ọzara Bia-sheba.


N'ihi ya ọ kpọrọ ebe ahu Bia-sheba; n'ihi na n'ebe ahu ka ha abua ṅuru iyi.


O si n'ebe ahu rigorue Bia-sheba.


Ma eze, bú Esa, mere ka Juda nile nu; ọ dighi onye puru ya: ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; eze, bú Esa, we were ha wue Geba Benjamin na Mizpa.


O we tua egwu, bilie, je n'ihi ndu-ya, biarue Bia-sheba, nke Juda nwere, o me ka nwa- okorọbia-ya nọdu n'ebe ahu.


site kwa n'ebo Benjamin; Geba na ebe-ita-nri-ya nile, na Alemet na ebe-ita-nri-ya nile, na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile. Obodo-ha nile bu obodo iri na atọ n'ab͕uru-ha nile.


ha agabigawo uzọ-ngabiga; Geba bu ebe-inọ-ọnọdu-abali ayi gēnwe, ka ha kwuru: Rema nāma jijiji, Gibea nke Sọl ab͕alagawo.


Otú ọ di, ndi Livai ndi si n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, mb͕e Israel kpafuru akpafu, ndi siri n'ebe M'nọ kpafue so arusi nile ha; ha aghaghi ibū kwa ajọ omume-ha.


ma unu achọla Bet-el, unu abà-kwa-la na Gilgal, unu agabiga-kwa-la ijeru Bia-sheba: n'ihi na aghaghi ime ka Gilgal je biri n'ala ọzọ, Bet-el gāghọ kwa ajọ ihe.


Ala nka nile gāghọ ihe di ka Araba, site na Geba rue Rimon na Ndida Jerusalem: agēbuli kwa ya elu, ọ gēbi kwa n'ọnọdu-ya, site n'ọnu-uzọ-ama Benjamim rue ebe ọnu-uzọ-ama mbu, rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, site kwa n'ulo-elu Hananel rue ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile nke eze.


na Kefa-amoni, na Ọfni, na Geba; obodo iri na abua na obodo ntà ha:


Site kwa n'ebo Benjamin, Gibeon na ebe-ita-nri-ya nile, na Geba na ebe-ita-nri-ya nile;


Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n'ebe Jehova nọ na Mizpa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan