Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 23:7 - Bible Nso

7 Ọ kwatu-kwa-ra ulo nile nke ndi edoro nsọ ikwa iko, nke di n'ulo Jehova, ebe ndinyom nākpara Ashera ulo-ikwū.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ọ kwadakwara ụlọ obibi ụmụ ndị ikom na-agba akwụna dị nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼebe ndị inyom na-anọ na-akpara Ashera akwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 23:7
14 Iomraidhean Croise  

Ọzọ kwa, ndi edoro nsọ ikwa iko di n'ala: ha mere dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


O we me ka ndi edoro nsọ ikwa iko si n'ala-ya gabiga, o wezuga-kwa-ra arusi nile nke nna-ya-hà mere.


Ọzọ, ndi fọduru n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko, bú ndi fọduru n'ubọchi Esa nna-ya, o kpochapuru ha n'ala.


Josaia we si n'ala nile nke umu Israel nwere wezuga ihe-árú nile, me ndi nile ahuru n'Israel ka ha fè òfùfè, ọbuná ifè Jehova, bú Chineke-ha, òfùfè. Ubọchi-ya nile ha esighi n'iso Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, wezuga onwe-ha.


I we chiri uwe-gi ufọdu, mere onwe-gi ebe di iche iche di elu nke aturu agwa, i we kwa iko n'elu ha: ihe di otú a ekwesighi ibia, ọ gaghi-adi kwa otú a.


O we me ka m'biarue oghere ọnu-uzọ-ama nke ulo Jehova nke di n'akuku Ugwu; ma, le, n'ebe ahu ka ndinyom nānọdu ala nākwara Tamuz ákwá.


M'gēji kwa ubọchi nile nke Bealim leta ya, bú ndi ọ nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, chiri nb͕a-aka-imi-ya na ihe-ichọ-nma-ya ke onwe-ya, jeso ndi nāhu ya n'anya, ma Mu ka o chezọrọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'elu ugwu nile ka ha nāchu àjà, n'elu ugwu ntà nile ka ha nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n'okpuru osisi oak na osisi poplar na osisi terebinth, n'ihi na ǹdò-ya di nma: n'ihi nka ka umu-unu ndinyom nākwa iko, ọ bu kwa n'ihi nka ka ndinyom unu luworo ọhu nākwa iko.


M'gaghi-eji nmehie-ha leta umu-unu ndinyom mb͕e ha nākwa iko, M'gāghi-eji kwa nmehie-ha leta ndinyom unu luworo ọhu mb͕e ha nākwa iko; n'ihi na ha onwe-ha nēwezuga onwe-ha so ndinyom nākwa iko, ha nēso kwa ndinyom edoro nsọ ikwa iko chua àjà: ma ndi ọ bula nke nādighi-aghọta ka agākwatu n'ala.


Israel we biri na Shitim, ndi Israel we malite isoro umu-ndinyom Moab nākwa iko:


Nwayi edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi n'etiti umu-ndinyom Israel, nwoke edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi kwa n'etiti umu-ndikom Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan