Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 23:5 - Bible Nso

5 O me-kwa-ra ndi-nchu-àjà arusi kwusi, bú ndi-eze Juda doro isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu n'obodo Juda nile, na n'ebe di Jerusalem buruburu; o me-kwa-ra ka ndi ahu kwusi, bú ndi nēsurere Beal, na anyanwu, na ọnwa, na kpakpando nējeghari ejeghari, na usu nile nke ihe elu-igwe, ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ọ chụdara ndị nchụaja arụsị ndị ahụ niile, bụ ndị eze Juda họpụtara isure ihe na-esi isi ụtọ nʼelu ebe dị elu nke obodo Juda nakwa ebe dị ọkụ. Nʼihi na ndị nchụaja ndị a achụọla aja, surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu niile dị nʼobodo dị iche iche na Juda, nakwa ndị dị gburugburu Jerusalem. Ha bụ ndị surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, na anyanwụ, ọnwa na kpakpando, nyekwa usuu niile nke mbara eluigwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 23:5
10 Iomraidhean Croise  

O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye usu nile nke ihe elu-igwe n'ogige abua nke ulo Jehova.


Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya kwaturu, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Bealim, me kwa Asherot, kpọ kwa isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.


Ha we kwatue ebe-ichu-àjà Bealim n'iru ya; o b͕utue arusi-anyanwu nile, nke di n'ebe di elu n'elu ugwu; o tipia-kwa-ra Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu, ọ supia ha, fesa n'elu ílì ndi nāchuru ha àjà.


Ì nēme ka Mazzaroth puta na mb͕e-ya? Ma-ọbu ì nēdu Bear na umu-ya?


O we sim, Nwa nke madu, Gì onwe-gi nāhu ihe ha onwe-ha nēme? bú ihe-árú nile di uku nke ulo Israel nēme n'ebe a, ka M'we si n'ebe nsọm je n'ebe di anya? ma i gāhu kwa oké ihe-árú ọzọ di iche iche.


Ọ bu bayere umu-ehi nke Bet-even ka ndi bi na Sameria gātu ujọ: n'ihi na ndi-ya gēruru ya újú, ha na ndi-nchu-àjà-ya ndi nētere ya-ri egwú ọṅù, n'ihi nsọpuru-ya, n'ihi na o siwo n'ebe ọ nọ je biri n'ala ọzọ.


M'gēseti kwa akam imegide Juda, na imegide ndi nile bi na Jerusalem; M'gēbipu kwa ndi Beal fọduru n'ebe a, na aha ndi-nchu-àjà arusi, ha na ndi-nchu-àjà nile;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan