Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 23:3 - Bible Nso

3 Eze we guzo n'akuku ogidi, b͕a ndu n'iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n'iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n'akwukwọ a guzosie ike: ndi Juda nile we guzo n'ọb͕ub͕a-ndu ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu Onyenwe anyị, ịgbaso Onyenwe anyị, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile, debe ihe niile o nyere nʼiwu, nʼihe ama ya niile na ụkpụrụ ya niile. O si otu a mee ka okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ guzosie ike. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile kwekwara nkwa idebe ọgbụgba ndụ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 23:3
36 Iomraidhean Croise  

ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi, dika ikpé si di, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, kpọ, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.


Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n'etiti Jehova na eze na ndi Juda, na ha gābu ndi Jehova nwere; na n'etiti eze na ndi Juda.


Juda nile we ṅuria ọṅu n'ọṅuṅu-iyi ahu: n'ihi na ha were obi-ha nile ṅua iyi, were kwa otú ọ nātọzu ha utọ chọ Ya; O we me ka ha chọta Ya: Jehova we me ka ha zuru ike buruburu.


ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi-ya na nbata, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì; ndi-ọbù-abù ji kwa ihe abù kpọ, ndi nēme ka amara ito otuto nọ kwa. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.


Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n'etiti ya na ndi Juda nile na eze, na ha gābu ndi Jehova nwere.


Ub͕u a ọ di n'obim ka ayi na Jehova, bú Chineke Israel, b͕a ndu, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe ayi nọ chigharia.


Ma ub͕u a ka ayi na Chineke-ayi b͕a ndu na ayi gēme ka ndinyom ahu nile na umu amuru site na ha pua, dika ndumọdu si di nke Onye-nwe-ayi, na nke ndi nāma jijiji n'ihe nile nke Chineke-ayi nyere n'iwu; dika iwu-Ya si di ka agēme kwa ya.


Ma ndi bu ndi-isi n'ikà ihe nile akara akàrà bu, Nehemaia, bú Tiashata, nwa Hakalaia, na Zedekaia;


Arurupu-kwa-ram obi-uwem, si, Ka Chineke rurupu nwoke ọ bula otú a site n'ulo-ya, site kwa na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, bú onye nādighi-eme ka okwu a guzosie ike; ọbuná otú a ya bu ihe arurupuworo, nke tọb͕ọ-kwa-ra n'efu. Nkpọkọta ahu nile we si, Amen, ha we to Jehova. Ndi-ayi we me dika okwu a si di.


Ma n'ihi ihe a nile ka ayi onwe-ayi nēme ọb͕ub͕a-ndu kwesiri ntukwasi-obi, ayi nēde kwa ya n'akwukwọ; ndi-isi-ayi na ndi Livai ayi na ndi-nchu-àjà-ayi bu kwa ndi-isi n'ikà ihe ahu akara akàrà.


Moses we bia, kọrọ ndi Israel okwu Jehova nile, na ikpé-Ya nile; ndi Israel nile we za n'otù olu, si, Okwu nile Jehova kwuworo, ayi gēme ha.


Mu onwem nādu gi ọdu, Debe okwu-ọnu eze, ọbuná n'ihi ọṅuṅu-iyi Chineke.


Unu onwe-unu we chigharia ta, we me ihe ziri ezi n'anyam abua, n'ikpọsa, onye ọ bula ọ gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya pua n'aka-gi; unu we b͕a ndu n'irum n'ulo nke akpọkwasiri aham:


Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Zedekaia, bú eze, na ndi Israel nile ndi nọ Jerusalem, b͕asiri ndu, ikpọsara ha si na ha nwere onwe-ha;


i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.


Ha gāju ajuju uzọ isi je Zaion, nēche iru-ha n'ebe a, si, Bianu, were onwe-unu rapara n'aru Jehova n'ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nke anāgaghi-echezọ echezọ.


Ma ub͕u a, Israel, gini ka Jehova, bú Chineke-gi, nāriọ n'aka-gi, ma-ọbughi itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ije ije n'uzọ-Ya nile, na ihu Ya n'anya, na iwere obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile fè Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè,


O gēru kwa, ọ buru na unu ejisie ike ige nti ihem nile enyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè,


Jehova, bú Chineke-unu, ka unu ganējeso n'azu, Ya ka unu gātu egwu, ihe nile O nyere n'iwu ka unu gēdebe, olu-Ya ka unu gēge nti, Ya ka unu gēfè òfùfè, Ya ka unu gārapara n'aru.


Ndia bu okwu ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Jehova nyere Moses n'iwu ka ya na umu Israel b͕a n'ala Moab, nāgughi ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Ya na ha b͕ara nime Horeb.


ndia bu ihe-àmà, na ukpuru, na ikpé, nke Moses gwara umu Israel, mb͕e ha si n'Ijipt puta;


Ma nka bu ihe ahu enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere iwu ka ezí unu, ka unu we me ha n'ala ahu ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya;


i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, were kwa ike-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya.


Ọ gēru kwa, ọ buru na i chezọ Jehova, bú Chineke-gi, we nējeso chi ọzọ, fè ha òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ha, ab͕awom àmà megide unu ta na unu aghaghi ila n'iyì.


na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru.


Ma Chineke nke udo, Onye were ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ahu si na ndi nwuru anwu kughachi oké Onye-ọzùzù-aturu nke aturu-Ya, bú Onye- nwe-ayi Jisus,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan