Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 23:16 - Bible Nso

16 Josaia we chigharia onwe-ya, hu ílì nile nke di n'ebe ahu n'ugwu ahu; o we zìe, chipu ọkpukpu n'ílì nile, sure ha ọku n'elu ebe-ichu-àjà ahu, merua ya, dika okwu Jehova si di nke onye nke Chineke ahu kpọsara, bú onye kpọsara ihe ndia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Josaya legharịkwara anya gburugburu hụ ọtụtụ ili dị nʼelu ugwu. O ziri ndị ohu ya ka ha gaa chịpụtasịa ọkpụkpụ dị nʼili ahụ niile, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja imerụ ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke onye nke Chineke kwupụtara mgbe o buru amụma banyere ihe ndị a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 23:16
6 Iomraidhean Croise  

N'ihi na okwu ahu aghaghi irè, bú nke ọ kpọrọ òkù n'okwu Jehova megide ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, megide kwa ulo nile nke ebe di elu nke di n'obodo nile nke Sameria.


O tipia-kwa-ra ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, were ọkpukpu madu mejue ọnọdu-ha.


M'gātọb͕ọ kwa ozu nile nke umu Israel n'iru arusi nile ha; M'gātusa kwa ọkpukpu-unu buruburu ebe-ichu-àjà nile unu.


Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.


Ọ buru na Ọ kpọrọ ndi ahu chi, ndi okwu Chineke biaruru (apughi kwa imebi ihe edere n'akwukwọ nso),


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan