Eze we rigorue ulo Jehova, ya na ndikom nile nke Juda, na ndi nile ndi bi na Jerusalem, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi Juda nile, site n'onye ntà we rue onye uku: o we gua na nti-ha okwu nile nke akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu nke achọtaworo n'ulo Jehova.
Joshua we chikọta ebo nile nke Israel rue Shekem, ọ kpọ ndi-okenye Israel, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha; ha we guzo onwe-ha n'iru Chineke.