Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 22:9 - Bible Nso

9 Shefan, bú ode-akwukwọ, we biakute eze, weghachiri eze okwu, si, Ndi-orù-gi awupuwo ego ahu nke anāchọta n'ulo ahu, ha we nye ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ulo Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mgbe ahụ, Shefan, bụ ode akwụkwọ, bịakwutere eze, gwa ya sị, “Ndị ozi gị enyefela ego niile nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼaka ndị ọrụ na nʼaka ndị nlekọta nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 22:9
13 Iomraidhean Croise  

Ha we kpọ eze òkù, Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we pukuru ha.


Shefan, bú ode-akwukwọ, we gosi eze, si, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, enyewom otù akwukwọ. Shefan we gua ya n'iru eze.


Eze we nye Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam nwa Shefan, na Akboa nwa Maikaia, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si,


O rue, n'arọ nke-iri-na-asatọ nke eze Josaia, na eze zigara Shefan nwa Azalaia, nwa Meshulam, bú ode-akwukwọ, n'ulo Jehova, si,


Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, we si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n'ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu, ọ gua ya.


Ma ndi fọduru n'ala Juda, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha fọdu, o we me Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, ka ọ buru onye-nlekọta-ha.


Ma otú ọ di, aka Ahaikam nwa Shefan di n'akuku Jeremaia, ka ha we ghara inye ya n'aka ndi Israel ime ka ọ nwua.


site n'aka Elasa nwa Shefan, na Gemaraia nwa Hilkaia, (ndi Zedekaia, bú eze Juda, zigara Nebukadneza, bú eze Babilon, rue Babilon,) si,


ha we ziga, weputa Jeremaia n'ogige ulo-nche, nye ya n'aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, ka o we me ka ọ pua la: o we biri n'etiti ndi Israel.


Ọzọ kwa, ndi-Ju nile ndi nọ na Moab, na n'etiti umu Amon, na n'Edom, na ndi nọ n'ala nile, nuru na eze Babilon enyewo Juda ndi fọduru, na o mewo kwa Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye-nlekọta-ha;


Ishmael nwa Netanaia we bilie, ya na ndikom iri ahu ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we were mma-agha tib͕ue Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we me ka ọ nwua, bú onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala ahu.


Ma ọgu ndikom atọ na iri nime ndi-okenye nke ulo Israel nēguzo n'iru ha, Jeazanaia nwa Shefan nēguzo kwa n'etiti ha, onye ọ bula o jide ihe-ya iji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'aka-ya; ísì utọ nke igwe-oji nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ anēsure we rigo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan