Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 21:7 - Bible Nso

7 Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke Ashera, bú nke o mere, n'ulo ahu nke Jehova siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, N'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 O were chi Ashera a pịrị apị, bụ nke o mere, debe nʼime ụlọnsọ ahụ, nke Onyenwe anyị gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu, sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 21:7
25 Iomraidhean Croise  

Onye ahu gēwuru aham ulo, M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.


ka anya-Gi abua we nāsaghe n'ebe ulo a di abali na ehihie, bú n'ebe ebe ahu di nke I siworo, Aham gādi n'ebe ahu: ige nti ekpere nke orù-Gi gēkpe n'ebe a di.


Mb͕e ndi-Gi gāpu ibuso onye-iro-ha agha, n'uzọ ọ bula I gēziga ha, ha we kpere Jehova n'uzọ obodo ahu nke I rọputaworo, na n'ebe ulo a di nke m'wuworo aha-Gi:


Jehova we si ya, Anuwom ekpere-gi na aririọ-amara-gi, nke i riọworo n'irum: edowom ulo a, nke i wuworo, nsọ, itiye aham n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi; anyam abua na obim gādi kwa n'ebe ahu ubọchi nile.


M'gēbipu kwa Israel n'elu ala nka nke M'nyeworo ha; M'gēsi kwa n'irum tupu ulo a, nke M'doworo nsọ nye aham; Israel gāghọ kwa ilu na ihe-àkùkù n'etiti ndi ọzọ nile:


Uraija, bú onye-nchu-àjà, we wue ebe-ichu-àjà ahu: dika ihe nile si di nke eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs zite, otú a ka Uraija, bú onye-nchu-àjà, mere, rue mb͕e eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs bia.


O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche n'ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka M'gētiye aham.


Jehova we si, M'gēsi kwa n'irum wezuga Juda, dika M'wezugara Israel, M'gāju kwa obodo a nke M'rọputaworo, bú Jerusalem, na ulo ahu nke M'siri, Aham gādi n'ebe ahu.


Eze we nye Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nke usoro nke-abua, na ndi nēche nbata-uzọ, iwu, isi n'ulo Jehova weputa ihe nile nke emeworo nye Beal, nye kwa Ashera, nye kwa usu nile nke ihe elu-igwe: o we sure ha ọku n'azu Jerusalem n'ọhia Kidron, būru ntu-ha je Bet-el.


O si-kwa-ra n'ulo Jehova buputa Ashera je n'azu Jerusalem, rue miri-iyi Kidron, sure ya ọku n'akuku miri-iyi Kidron, supia ya me ka ọ di ka uzuzu, kpofue uzuzu-ya n'elu ílì ndi efu.


O wezuga-kwa-ra chi nile nke ala ọzọ, si kwa n'ulo Jehova wezuga oyiyi-ihe ahu, ya na ebe-ichu-àjà nile nke o wuru n'ugwu ulo Jehova, na nime Jerusalem, o kpofue ha n'azu obodo.


Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke oyiyi-ihe ahu, bú nke o mere, n'ulo Chineke, bú nke Chineke siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, Ṅ'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:


ma arọputaram Jerusalem, ka aham we di n'ebe ahu; arọputa-kwa-ram Devid ibu onye-isi ndim, bú Israel.


Jehova we me ka Solomon hu Ya anya n'abali, Ọ si ya, Anuwom ekpere-gi, rọputa-kwa-ra Onwem ebe a ibu ulo ichu àjà.


Ma ub͕u a arọputawom ulo a, do kwa ya nsọ, ka aham we di n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi: anyam abua na obim gādi kwa n'ebe ahu ubọchi nile.


M'gēropu kwa ha n'elu alam nke M'nyeworo ha; M'gēsi kwa n'irum tupu ulo a, nke M'doworo nsọ nye aham, M'gēme kwa ya ilu na ihe-àkùkù n'etiti ndi ọzọ nile.


ma asi na unu alaghachikutem, we debe ihe nile M'nyere n'iwu me kwa ha, ọ buru na ndi-unu anāchufu adi na nsọtu elu-igwe, site n'ebe ahu ka M'gāchikọta ha, me ka ha biarue ebe ahu nke M'rọputaworo ime ka aham biri n'ebe ahu.


Cheta nzukọ-Gi, nke I nwetaworo na mb͕e ochie, Nke I b͕aputaworo ibu ebo nke ihe-nketa-Gi; Cheta ugwu Zaion, ebe I biworo.


Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe, Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo.


Ha we do ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.


N'ihi na umu Juda emewo ihe jọrọ njọ n'anyam; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ha edowo ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.


Ọzọ kwa, nka ka ha meworom: ha emeruwo ebe nsọm n'ubọchi ahu, me ka ubọchi-izu-ikem nile ghara idi nsọ.


Akurula onwe-gi Ashera nke osisi ọ bula n'akuku ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, nke i gēmere onwe-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan