Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 21:4 - Bible Nso

4 O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche n'ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka M'gētiye aham.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya sị, “Ọ bụ na Jerusalem ka m ga-etinye Aha m.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 21:4
18 Iomraidhean Croise  

Onye ahu gēwuru aham ulo, M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.


ka anya-Gi abua we nāsaghe n'ebe ulo a di abali na ehihie, bú n'ebe ebe ahu di nke I siworo, Aham gādi n'ebe ahu: ige nti ekpere nke orù-Gi gēkpe n'ebe a di.


Jehova we si ya, Anuwom ekpere-gi na aririọ-amara-gi, nke i riọworo n'irum: edowom ulo a, nke i wuworo, nsọ, itiye aham n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi; anyam abua na obim gādi kwa n'ebe ahu ubọchi nile.


Ebe-ichu-àjà nile nke di n'elu ime-ulo-elu nke Ehaz, nke ndi-eze Juda mere, na ebe-ichu-àjà nile nke Manase mere n'ogige abua nke ulo Jehova, eze kwaturu ha, we si n'ebe ahu b͕a ọsọ, kpofue uzuzu-ha nime miri-iyi Kidron.


Jehova we si, M'gēsi kwa n'irum wezuga Juda, dika M'wezugara Israel, M'gāju kwa obodo a nke M'rọputaworo, bú Jerusalem, na ulo ahu nke M'siri, Aham gādi n'ebe ahu.


Site n'ubọchi mb͕e M'mere ka ndim si n'ala Ijipt puta, arọputaghm obodo n'ebo nile nke Israel iwu ulo, ka aham we di n'ebe ahu; arọputaghkwam nwoke ọ bula ibu onye-ndú ndim, bú Israel:


ma arọputaram Jerusalem, ka aham we di n'ebe ahu; arọputa-kwa-ram Devid ibu onye-isi ndim, bú Israel.


Ebe-ichu-àjà nke ájá ka i gēmerem, chu kwa àjà-nsure-ọku-gi nile na àjà-udo-gi nile n'elu ya, bú ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi: n'ebe nile ọ bula ebe M'nēme ka echeta aham, n'ebe ahu ka M'gābiakute gi, gọzi kwa gi.


N'ihi na ihe ikpasu iwem na ikpasu ọnumam ka obodo a buruworom site n'ubọchi mb͕e ha wuru ya we rue ta; ka M'we si n'irum wezuga ya:


Ha we do ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.


Ha we wue ebe nile di elu nke Beal, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, ime ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom si n'ọku gabigarue Molek; bú ihe nke M'nēnyeghi ha n'iwu, ọ bataghi kwa n'obim, ka ha we me ihe-árú a; ime ka Juda mehie.


N'ihi na umu Juda emewo ihe jọrọ njọ n'anyam; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ha edowo ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.


Ọzọ kwa, nka ka ha meworom: ha emeruwo ebe nsọm n'ubọchi ahu, me ka ubọchi-izu-ikem nile ghara idi nsọ.


N'ihi na mb͕e ha b͕uru umu-ha ndikom nye arusi nile ha, ha we bata n'ebe nsọm ubọchi ahu ime ka ọ ghara idi nsọ; ma, le, otú a ka ha meworo n'etiti ulom.


Kama rue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa n'ebo-unu nile, itiye aha-Ya n'ebe ahu, rue ebe-obibi-Ya ka unu gāchọ, i gābà kwa n'ebe ahu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan