Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 21:23 - Bible Nso

23 Ndi-orù Emon we kekọta onwe-ha imegide ya, ha we me ka eze nwua n'ulo-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu eze nʼime ụlọeze ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 21:23
8 Iomraidhean Croise  

Beasha, bú nwa Ahaija, nke ulo Isaka, we kekọta madu imegide ya; Beasha we tib͕ue ya na Gibeton, nke diri ndi Filistia; n'ihi na Nedab na Israel nile nānọchigide Gibeton n'agha.


Orù-ya Zimri, bú onye-isi nkera ub͕ọ-ala-ya, we kekọta madu imegide ya: ma ya onwe-ya nọ na Tiaza, nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo Aza, onye bu onye-isi ulo-ya na Tiaza:


Ndi-orù-ya we bilie, kekọta nkekọta-madu imegide ya, tib͕ue Joash n'ulo Milo, n'uzọ nke nāridaru Sila.


Ha we kekọta nkekọta-madu megide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n'ebe ahu.


Peka nwa Remalaia, bú onye-isi-agha-ya, we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya nime Sameria, n'ulo-elu nke ulo eze, ya na Agob na Arie; ọgu ndikom abua na iri nke umu ndi Gilead nọye-kwa-ra ya: o we me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya.


Hoshea nwa Ila we kekọta nkekọta-madu megide Peka nwa Remalaia, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya, n'arọ nke-orú nke Jotam nwa Uzaia.


Ma Ehazaia, bú eze Juda, huru ya, b͕alaga n'uzọ ulo ubi ab͕ara ogige. Jihu we chuso ya, si, Tib͕u-kwa-nu ya n'ub͕ọ-ala-ya. Ha we tib͕ue ya na nrigo Gua, nke di nso Ibleam. O we b͕alaga na Megido, nwua n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan