Beasha, bú nwa Ahaija, nke ulo Isaka, we kekọta madu imegide ya; Beasha we tib͕ue ya na Gibeton, nke diri ndi Filistia; n'ihi na Nedab na Israel nile nānọchigide Gibeton n'agha.
Orù-ya Zimri, bú onye-isi nkera ub͕ọ-ala-ya, we kekọta madu imegide ya: ma ya onwe-ya nọ na Tiaza, nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo Aza, onye bu onye-isi ulo-ya na Tiaza:
Peka nwa Remalaia, bú onye-isi-agha-ya, we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya nime Sameria, n'ulo-elu nke ulo eze, ya na Agob na Arie; ọgu ndikom abua na iri nke umu ndi Gilead nọye-kwa-ra ya: o we me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya.
Ma Ehazaia, bú eze Juda, huru ya, b͕alaga n'uzọ ulo ubi ab͕ara ogige. Jihu we chuso ya, si, Tib͕u-kwa-nu ya n'ub͕ọ-ala-ya. Ha we tib͕ue ya na nrigo Gua, nke di nso Ibleam. O we b͕alaga na Megido, nwua n'ebe ahu.