Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 21:11 - Bible Nso

11 N'ihi na Manase, bú eze Juda, emewo ihe-árú ndia, we me ihe ọjọ kari ihe nile nke ndi-Amorait mere, ndi buru ya uzọ, o we were arusi-ya nile me ka Juda mehie kwa:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 “Nʼihi na Manase, eze Juda emeela ihe arụ ndị a, o meela ihe dị njọ karịa nke ndị Amọrait, bụ ndị bụ ya ụzọ, o werela arụsị ya duba Juda nʼime mmehie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 21:11
21 Iomraidhean Croise  

Ma n'ọb͕ọ nke-anọ ka ha gālata n'ebe a: n'ihi na ajọ omume ndi-Amorait akēzughi.


Ọ gārara kwa Israel nye n'ihi nmehie Jeroboam nile, nke o mehieworo, na nke o ji me ka Israel mehie.


n'ihi nmehie nile nke Jeroboam nke o mehiere, na nke o ji me ka Israel mehie; nime nkpasu-iwe-ya nke o ji kpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe.


n'ihi nmehie-ya nile nke ọ mehiere, n'ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, n'ije ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie nke o mere, ime ka Israel mehie.


Ọ we me ihe-árú nke-uku n'ijeso arusi di iche iche, dika ihe nile si di nke ndi-Amorait mere, ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.)


Ma o jere ije n'uzọ ndi-eze Israel. Ọzọ kwa, o mere ka nwa-ya nwoke gabiga nime ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


Jehova we kwue site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma, si,


Ọzọ kwa, Manase wusiri ọbara nke-uku ri nne, bú nke nēmeghi ihe ọjọ, rue mb͕e o mejuru Jerusalem site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ; nāgughi nmehie-ya nke o jiri me ka Juda mehie, ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere.


O we je ije n'uzọ nile nke nna-ya jere, o we fè arusi òfùfè nke nna-ya fère, ọ kpọ isi ala nye ha:


Ma ha anugh: Manase we me ka ha sihie uzọ ime ihe ọjọ kari mba ọzọ, bú ndi Jehova kpochapuru n'iru umu Israel.


Ọzọ kwa, ndi nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa, na teraphim, na arusi nile, na ihe-árú nile nke ahuru n'ala Juda, na nime Jerusalem, ndia ka Josaia tkpochapuru, ka o we me ka okwu nile nke iwu guzosie ike, bú nke edeworo n'akwukwọ nke Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara n'ulo Jehova.


na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait;


M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n'ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n'ihi ihe o mere na Jerusalem.


si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri Jerusalem: Nputa-uwa-gi na ọmumu-gi sitere n'ala ndi Kenean; nna-gi ka onye-Amorait bu, ọ bu kwa nne-gi ka onye Het bu.


Nwa-nwanyi nke nne-gi ka i bu, nke nāsọ di-ya na umu-ya oyi; ọ bu kwa nwa-nne nke umu-nne-gi ndinyom ka i bu, ndi sọrọ di-ha na umu-ha oyi: nne-unu bu onye Het, nna-unu bu kwa onye-Amorait.


onye ewedara n'ala na ob͕eye ka o meworo ihe-ike, ọ punarawo madu ihe n'ike, ọ dighi-enyeghachi ihe-ibe, ọ bu kwa arusi nile ka o weliworo anya-ya abua le, ihe-árú ka o meworo,


O we nupu isi n'okpuru ikpém nile n'imebi iwu kari mba nile, na n'okpuru ukpurum nile karia ala nile nke di ya buruburu: n'ihi na ikpém nile ka ha juworo, ma ukpurum nile, ha ejegharighi nime ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan