Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 20:13 - Bible Nso

13 Hezekaia we ge ha nti, me ka ha hu ulo nile nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n'àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n'ulo-ya, ma-ọbu n'ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Hezekaya nabatara ndị ozi ahụ gosi ha ihe niile dị nʼụlọakụ ya, ọlaọcha, na ọlaedo, ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ na ezigbo mmanụ oliv, ụlọ ebe ngwa agha ya niile dị, na ihe niile bụ akụ o nwere. Ọ dịghị ihe dị nʼụlọeze ya maọbụ nʼalaeze ya niile nke ọ na-egosighị ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 20:13
12 Iomraidhean Croise  

O nye eze ọgu talent ọla-edo isi, na uda di iche iche bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: ọ dighi uda biara ọzọ nke di ka uda ahu n'iba-uba, bú nke eze-nwayi Sheba nyere eze, bú Solomon.


nāgughi ihe ndikom ndi nējeghari izu ahia wetara, na ọzuzu-ahia nke ndi nāzu ahia, na ọla-edo nke eze nile nke ndi gwara ọgwa, na ọla-edo nke ndi nāchi ala.


Ọ biarue Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, gwa ya okwu nile nke di ya n'obi.


Ndi ahu nēbute kwa, nwoke ọ bula onyinye-inata-iru-ọma-ya, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, na ihe-ekike-agha, na uda di iche iche, na inyinya, na inyinya mule, ihe anēnye n'arọ n'arọ-ya.


Aisaia, bú onye-amuma, we biakute eze, bú Hezekaia, si ya, Gini ka ndikom ndia siri gi? òle ebe ka ha si kwa biakute gi? Hezekaia we si, Ọ bu n'ala di anya ka ha si bia, bú Babilon.


Ọ si, Gini ka ha huru n'ulo-gi? Hezekaia we si, Ihe nile nke di n'ulom ka ha huru: ọ dighi ihe di n'àkùm nile nke m'nēmeghi ka ha hu.


Otù ub͕ò ka Chineke kwuworo okwu, Ub͕ò abua ka m'nuworo nka; Na ike nile bu ihe Chineke nwere:


Ì gātukwasi anya-gi abua na ya? ọ dighi kwa: N'ihi na àkù nēmere onwe-ya nkù n'ezie, Dika ugo ka ọ nēfesi n'elu-igwe.


N'ezie ọ dighi onye ezi omume n'uwa, nke nēme ezi ihe, nādighi-emehie kwa.


Hezekaia we ṅuria ọṅu bayere ha, me ka ha hu ulo nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo nile nke ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n'àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n'ulo-ya, ma-ọbu n'ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu.


Kwue, si, Otú a ka ihe nke si n'ọnu Jehova puta siri, Ozu madu gāda dika ǹsí-anu n'ọhia, na dika nju-aka ọka n'azu onye nēwe ihe-ubi, ọ dighi kwa onye nāchikọta ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan