Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 2:9 - Bible Nso

9 O rue, mb͕e ha gabigasiri, na Elaija siri Elaisha, Riọ ihe m'gēmere gi, tutu ewepum n'ebe i nọ. Elaisha we si, Biko, ka òkè abua nke mọ-gi dikwasim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mgbe ha abụọ gafesịrị, Ịlaịja jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị tupu e site nʼebe ị nọ wepụ m?” Ịlaisha rịọrọ sị ya, “Biko, mee ka m nweta ụdị mmụọ i nwere okpukpu abụọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 2:9
23 Iomraidhean Croise  

i gēte kwa Jihu, bú nwa Nimshi, manu ibu eze Israel: i gēte kwa Elaisha, bú nwa Shefat, nke Ebel-mehola, ibu onye-amuma n'ọnọdu gi.


Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n'ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ́ ikpe?


Chineke, nye eze ikpé-Gi nile, Nye kwa nwa eze ezi omume-Gi.


Ekpere nke Devid nwa Jesi agwuwo.


N'ubọchi ahu ka Jehova gēb͕ochi ndi bi na Jerusalem; onye nāsu ngọngọ n'etiti ha n'ubọchi ahu gādi kwa ka Devid; ulo Devid gādi kwa ka Chineke, dika mọ-ozi nke Jehova n'iru ha.


Laghachinu n'ebe ewusiri ike, unu ndi-nkpọrọ nke olile-anya ahu: ọbuná ta ka M'nēgosi na ọ bu okpukpu abua ka M'gēnyeghachi gi.


M'gāridata, kpayere gi uka n'ebe ahu M'gānara kwa ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasi gi, tukwasi ha; ha gēso kwa gi bū ibu ndi Israel, ka i we ghara ibū ya, nání gi onwe-gi.


Jehova we ridata n'igwe-oji ahu, gwa ya okwu, nara ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasiri ya, tiyekwasi n'ọgu ndi-okenye atọ na iri ahu: o rue, mb͕e Mọ ahu bekwasiri ha, na ha buru amuma, ma ha emeghi ya ọzọ.


Otú ọ di, Mu onwem nāgwa unu ezi-okwu; Ọ bu ihe bara unu urù ka Mu onwem la: n'ihi na asi na alaghm, Onye-nkasi-obi ahu agaghi-abiakute unu; ma ọ buru na alam, M'gēzite Ya nye unu.


Ma unu gānata ike, mb͕e Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàmnime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu.


Mb͕e ahu ha bikwasiri ha aka-ha n'isi, ha we nara Mọ Nsọ.


Ma werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara ndia nke kari uku. Tukwasi ihe ndia anamegosi kwa unu uzọ nke kachasi nma.


kama ọ gēkwe na ọkpara ka ọ bu, bú nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, n'inye ya òkè abua n'ihe ọ bula ahutara n'aka-ya: n'ihi na nwa ahu bu nkpuru mbu nke ume-ya; ọ bu ya nwe ihe ekpeziri ọnọdu-ọkpara.


Joshua nwa Nun we juputa na mọ nke amam-ihe; n'ihi na Moses ebikwasiwo ya aka-ya abua: umu Israel we ge ya nti, me kwa dika Jehova nyere Moses iwu.


Ka agua ndi-okenye na ndi kwesiri nsọpuru okpukpu abua, bú ndi nāchi isi nke-ọma, ma nke kachasinu ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nime okwu Chineke na ozizí.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan