Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 2:5 - Bible Nso

5 Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko we biarue Elaisha nso, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n'ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ndị otu ndị amụma nọ na Jeriko bịakwutere Ịlaisha nso jụọ ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-ewepụ onyenwe gị taa?” Ọ zara, “E, amaara m, ya mere nọọnụ nwayọọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 2:5
18 Iomraidhean Croise  

Nna-ya we ju, si, Amawom, nwam, amawom: ya onwe-ya gāghọ kwa otù ndi, ya onwe-ya gādi kwa uku: ma otú ọ di, nwa-nne-ya nke-ntà gādi uku kari ya, nkpuru-ya gāghọ kwa ùjú nke mba nile.


Ma otù nwoke n'etiti umu ndi-amuma siri ibe-ya n'okwu Jehova, Biko, tiem ihe. Ma nwoke ahu juru iti ya ihe.


Umu ndi-amuma ndi nọ na Bet-el we pukute Elaisha, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n'ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti.


Ma otù nwayi n'etiti ndinyom umu ndi-amuma tikuru Elaisha nkpu, si, Orù-gi, bú dim, anwuwo: ma gi onwe-gi amawo na orù-gi nātu egwu Jehova: ma onye-nbinye-ego abiawo ichiri n'onwe-ya umum abua ka ha buru orù.


Ọ si, Udo di. Onye-nwem ezitewom, si, Le, ọbuná ub͕u a umu-okorọbia abua nime umu ndi-amuma esiwo n'ugwu Efraim biakutem; biko, nye ha otù talent ọla-ọcha, na uwe nb͕anwe abua.


Umu ndi-amuma we si Elaisha, Biko, le, ebe ayi onwe-ayi nēbi n'iru gi adikara ayi nkpa.


Ma Elaisha, bú onye-amuma, kpọrọ otù onye nime umu ndi-amuma, si ya, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, were karama manu a n'aka-gi, je Remot-gilead.


mb͕e idọwa adọwa, na mb͕e idukọta adukọta; mb͕e ib͕a nkiti, na mb͕e ikwu okwu;


B͕anu nkiti gem nti, unu agwe-etiti; ka ndi nile di iche iche b͕anwe kwa ike-ha: ka ha biarue nso; ka ha kwue okwu: ka ayi biarue onwe-ayi nso ikpe ikpe.


Emos we za, si Amazaia, Ọ dighi onye-amuma m'bu, ọ dighi kwa nwa onye-amuma m'bu; kama onye-nche-ehi ka m'bu, ya na onye nēdozi nkpuru osisi sycomore:


Ma Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ: dere du n'iru Ya, gi uwa nile.


O we rue, mb͕e Ọ nāgọzi ha, na Ọ kewapuru n'ebe ha nọ, ewe welie Ya la n'elu-igwe.


ndi si-kwa-ara, Ndikom nke Galili, gini mere unu nēguzo nēle anya n'elu-igwe? Jisus nka, Onye anapuru n'ebe unu nọ rigo n'elu-igwe, gābia n'otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n'elu-igwe.


rue ubọchi anara Ya n'elu, mb͕e O sitere na Mọ Nsọ nyesia ndi-ozi-Ya ndi Ọ rọputarari iwu:


Ma Pọl siri, Abughm onye anya nādighi nma, Festọs onye di oké ebube; anamekwuwa okwu nke ezi-okwu na nke anya-udo.


Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n'ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n'ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n'iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan