Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 2:2 - Bible Nso

2 Elaija we si Elaisha, Biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Bet-el, Elaisha we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha we ridarue Bet-el.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ịlaịja sịrị Ịlaisha, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Betel.” Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro gaa Betel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 2:2
17 Iomraidhean Croise  

Ọ kpọ aha ebe ahu Bet-el: ma otú ọ di Luz bu aha obodo ahu na mbu.


Eze we me ka adua ya ọdu, o we me umu-ehi abua nke ọla-edo; ọ si ha, Unu arigozuwo Jerusalem; le chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.


Ọ dọba otù nime Bet-el, tiye nke-ọzọ nime Dan.


Ọ rigorue ebe-ichu-àjà nke o mere na Bet-el n'ubọchi nke-iri-na-ise n'ọnwa nke-asatọ, bú n'ọnwa nke ọ chèputara n'obi-ya: o we mere umu Israel ememe, rigorue ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


O si n'ebe ahu rigorue Bet-el: ma mb͕e ya onwe-ya nārigo n'uzọ, umu-okoro siri n'obodo puta, we kwa ya emò, si ya, Rigo, onye-isi-nkwọcha; rigo, onye-isi-nkwọcha.


Elaija we si ya, Elaisha, biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Jeriko. Ọ si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha we biarue Jeriko.


Elaija we si ya, Biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezigawom ijeru Jọdan. Ọ si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. Ha abua we je.


Nne nwa-okoro ahu we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. O we bilie, jeso ya.


i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.


Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.


Hana we si, Biko, onyenwe m, nkpuru-obi-gi nādi ndu, onyenwe m, Mu onwem bu nwayi ahu nke guzoro onwe-ya nso gi n'ebe a, ikpere Jehova.


Ma mb͕e Sọl huru Devid ka ọ nāpu izute onye Filistia ahu, ọ siri Abnea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, Abnea, nwà onye ka nwa-okoro nka bu? Abnea we si, Nkpuru-obi-gi nādi ndu, eze, amaghm.


Ma ub͕u a, onye-nwem, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, ebe Jehova b͕ochiworo gi ka i ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka aka-gi ghara kwa izọputa gi, ub͕u a kwa ka ndi-iro-gi na ndi nāchọ ime onye-nwem ihe ọjọ di ka Nebal.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan