Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 2:19 - Bible Nso

19 Ndikom obodo ahu we si Elaisha, Biko, le, ọnọdu obodo a di nma, dika onye-nwem nāhu: ma miri-ya jọrọ njọ, ala nādighi-ekwe kwa ka ihe ka aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ndị obodo ahụ sịrị Ịlaisha, “Lee, onyenwe anyị, obodo anyị dị nʼebe dị mma, dịka gị onwe gị na-ahụ, ma mmiri dị nʼime ya jọrọ njọ, ala ya adịghị amịpụta mkpụrụ dịka o kwesiri.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 2:19
16 Iomraidhean Croise  

N'ubọchi-ya ka Hiel, bú onye Bet-el, wuru Jeriko: Abairam, bú ọkpara-ya, ka o were tọ ntọ-ala-ya; Segub, bú nwa-ya nwoke nke-ntà ka ọ were kwa guzo ọnu-uzọ-ama-ya ọtọ; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka Joshua nwa Nun.


Ègosighi onye-nwem ihe m'mere mb͕e Jezebel b͕uru ndi-amuma Jehova, na ezorom ọgu ndikom ise sitere na ndi-amuma Jehova, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, ogu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha?


Obadaia we nọ n'uzọ, ma, le, Elaija zutere ya: ọ mata ya, da kpue iru-ya n'ala, si, Ọ̀ bu gi bu nka, onye-nwem Elaija?


Ha we laghachikuru ya, ma ya onwe-ya nānọ na Jeriko; ọ si ha, Àsighm unu, Ejela?


Ọ si, Wetaranum ọkwa ọhu, tiye-kwa-nu nnú nime ya. Ha we wetara ya.


Ha we biarue Mara, ma ha apughi iṅu miri nke Mara, n'ihi na ilu ka ha di: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Mara.


Ọ gaghi-adi nwayi nēmebi ime ma-ọbu nwayi-àgà n'ala-gi: M'gēmezu ọnu-ọgugu ubọchi-gi.


Jehova we si Moses, Si Eron, Were nkpa-n'aka-gi setipu aka-gi n'elu miri nile nke Ijipt, n'elu osimiri nile ha, na n'elu osimiri Nail nile ha, na n'elu ọdọ-miri nile ha, na n'elu ebe-nchikọta-miri-ha nile, ka ha we ghọ ọbara; ọbara gādi kwa n'ala Ijipt nile, ma n'ihe nke osisi ma n'ihe nke nkume.


Nye ha, Jehova: gini ka I gēnye? nye ha afọ nēmebi ime na ara kpọrọ nku.


Eron we si Moses, Biko, onye-nwem, ariọm i, atukwasila ayi nmehie, nke ayi buru ndi-nzuzu nime ya, nke ayi mehiewo-kwa-ra nime ya.


Jehova gēme kwa ka i babiga uba okè bayere ezi ihe, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi.


Ka agua ndi-okenye na ndi kwesiri nsọpuru okpukpu abua, bú ndi nāchi isi nke-ọma, ma nke kachasinu ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nime okwu Chineke na ozizí.


Obodo ahu gābu ihe ewezugara nye Jehova, ya onwe-ya, na ihe nile di nime ya: nání Rehab, bú nwayi nākwa iko, gādi ndu, ya onwe-ya na ndi nile ya na ha nọ n'ulo, n'ihi na o zobere ndi-ozi ndi ayi zigara.


Joshua we b͕a ha iyi na mb͕e ahu, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu n'iru Jehova, nke gēbili wue obodo Jeriko a: ọkpara-ya ka ọ gēwere tọ ntọ-ala-ya, nwa-nwoke-ya nke-ntà ka ọ gēwere kwa guzo ọnu-uzọ-ama-ya ọtọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan