Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 2:1 - Bible Nso

1 O rue, mb͕e Jehova gaje ime ka Elaija rigorue elu-igwe n'oké ifufe, na Elaija siri na Gilgal je, ya na Elaisha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 O ruo mgbe Onyenwe anyị chọrọ ị kpọrọ Ịlaịja laa nʼeluigwe site nʼoke ifufe, Ịlaịja na Ịlaisha nọ nʼụzọ sitere Gilgal.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 2:1
15 Iomraidhean Croise  

Inok na Chineke we yikọ nējeghari: ọ nọghi kwa: n'ihi na Chineke kuru ya la.


Ọ gēru kwa, mb͕e mu onwem si n'ebe i nọ je, na Mọ nke Jehova gēburu gi jerue ebe m'nāmaghi; ma mb͕e m'biara igosi Ehab, ma ọ chọtaghi gi, ọ gēb͕ukwam: ma orù-gi nātu egwu Jehova site na mb͕e m'di na nwata.


Ọ si, Pua, guzo n'ugwu n'iru Jehova. Ma, le, Jehova nāgabiga, oké ifufe di ike nāb͕ọwa kwa ugwu nile, nētipia kwa nkume di elu nile n'iru Jehova; ma Jehova anọghi n'ifufe ahu: ma mb͕e ifufe gasiri ala-ọma-jijiji mara; ma Jehova anọghi n'ala-ọma-jijiji ahu:


Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n'ọzara, bia nọdu n'okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n'ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà.


Ma ihe Ehazaia nile nke fọduru nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?


O rue na, mb͕e ha nọ nēje, nēje ije nēkwu kwa okwu, le, ub͕ọ-ala ọku na inyinya ọku, nke kewara ha abua; Elaija we rigorue elu-igwe n'oké ifufe.


Ma Elaisha biaghachiri rue Gilgal: ma oké unwu di n'ala ahu; umu ndi-amuma nānọdu kwa ala n'iru ya: o we si nwa-okorọbia-ya, Tukwasi ite uku n'ọku, siere umu ndi-amuma ofé.


Jehova we si n'oké ifufe za Job, si,


O rue, mb͕e ubọchi nēzu okè mb͕e agānara Ya n'elu, na Ya onwe-ya che iru-Ya si-ike iga Jerusalem,


Mb͕e O kwusiri okwu ndia, mb͕e ha nēle anya, ewe welie Ya elu; igwe-oji we nara Ya, Ọ pua n'anya-ha.


Okwukwe ka eji būbiga Inok ka ọ ghara ihu ọnwu; ahughi kwa ya, n'ihi na Chineke bubigara ya-ri: n'ihi na mb͕e akēbubigaghi ya ab͕aworo ya àmà na ihe ọ nēmeri nātọ Chineke ezi utọ:


Ndi Israel we si na Jọdan rigota n'ubọchi nke-iri nke ọnwa mbu, má ulo-ikwū-ha na Gilgal, na nsọtu ọwuwa-anyanwu Jeriko.


Jehova we si Joshua, Ta ka M'kpochapuworo ihe-ita-uta nke Ijipt n'aru unu. Ewe kpọ aha ebe ahu Gilgal, rue ta.


Ha we nu oké olu nke si n'elu-igwe da, ka ọ nāsi ha, Rigotanu n'ebe a. Ha we rigo rue n'elu-igwe nime igwe-oji ahu; ndi-iro-ha kiri-kwa-ra ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan