Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.
ya bu na agēmebi ọb͕ub͕a-ndum, nke Mu na Devid, bú orùm, b͕ara, ka o we ghara inwe nwa-nwoke nke bu eze n'elu oche-eze-ya; na ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi Livai, bú ndi-nchu-àjà, ndi nējerem ozi, b͕ara.
ya bu na M'gāju nkpuru Jekob, na Devid, bú orùm, M'we ghara isi na nkpuru-ya were ndi ganāchi nkpuru nke Abraham na Aisak na Jekob: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha.
N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bughi n'ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, unu ulo Israel, kama ọ bu n'ihi aha nsọm, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile ebe unu biara.
Ma n'aru ulo Juda ka M'gēnwe obi-ebere, M'gēji kwa Jehova, bú Chineke-ha, zọputa ha, ma M'gaghi-eji uta, ma-ọbu mma-agha, ma-ọbu agha, ma-ọbu inyinya, ma-ọbu ndi-inyinya, zọputa ha.
M'gāma-kwa-ra ulom ulo-ikwū, dika ebe-nguzo-ndi-agha, n'ihi onye-ngabiga na n'ihi onye nālata: ka onye nāchi n'ihe-ike we ghara igabiga kwa n'akuku ha ọzọ: n'ihi na ub͕u a ka M'jiworo anyam abua hu.
Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro, Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie, Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu, Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile.