Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 19:2 - Bible Nso

2 O we zìe Elaiakim, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na ndi-okenye ndi-nchu-àjà, ndi wereworo ákwà-nkpe kpuchie onwe-ha, o we zìe ha jekuru Aisaia, bú onye-amuma, nwa Emoz.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 O zipụrụ Eliakịm onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ eze na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 19:2
13 Iomraidhean Croise  

Devid we si Joab, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Dọwanu uwe-unu, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tie aka n'obi n'iru Abnea. Eze, bú Devid, nējeso kwa ihe eji ebu ozu.


O rue, mb͕e ha huru na ego ahu riri nne n'ib͕e ahu, na ode-akwukwọ eze na onye-isi-nchu-àjà rigoro, ke ego ahu n'ihe, gu kwa ya, bú nke achọtara n'ulo Jehova.


Ha we kpọ eze òkù, Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we pukuru ha.


Ha we si ya, Otú a ka Hezekaia siri, Ubọchi ahuhu na iba-nba na nlelì-anya ka ubọchi ta bu: n'ihi na umu abiaruwo ebe-nmuputa, ma ike adighi imu ha.


Ma ihe nile nke Uzaia mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, dere ha n'akwukwọ.


Ọhù Aisaia nwa Emoz, nke ọ huru bayere Juda na Jerusalem n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda.


Okwu nke Aisaia nwa Emoz huru bayere Juda na Jerusalem.


Otú a ka Jehova siri, Je, zuta karama nke ọkpu-ite ji urọ akpu, chiri kwa ufọdu nime ndi-okenye ndim, na nime ndi-okenye ndi-nchu-àjà;


Ma ha atughi oké egwu, ha adọwaghi kwa uwe-ha, bú eze na ndi-orù-ya nile ndi nānu okwu ndia nile.


ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,


dika edeworo ya n'akwukwọ okwu Aisaia onye-amuma, si, Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan