Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 18:6 - Bible Nso

6 O we rapara Jehova n'aru, o sighi n'iso Ya wezuga onwe-ya, o we debe ihe nile O nyere n'iwu, bú nke Jehova nyere Moses n'iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ọ gbasoro Onyenwe anyị nʼụzọ niile. O sitekwaghị nʼụzọ Onyenwe anyị wezuga onwe ya. O debere ihe niile Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 18:6
15 Iomraidhean Croise  

Jehova we b͕ara Israel àmà, b͕a-kwa-ra Juda, site n'aka onye-amuma ọ bula, na onye-ọhu-uzọ ọ bula, si, Sinu n'uzọ ọjọ nile unu laghachi, debe ihe nile M'nyere n'iwu, na ukpurum nile, dika iwu ahu nile si di nke M'nyere nna-unu-hà n'iwu, nke M'zite-kwa-ra unu n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma.


Ha we rapu ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, ha we mere onwe-ha arusi awuru awu, bú umu-ehi abua, me kwa Ashera, kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè Beal òfùfè.


Juda edebeghi kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, kama ha jeghariri n'ukpuru nile nke Israel nke ha mere.


Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.


si, Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.


nke M'nyere nna-unu-hà n'iwu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt, si n'oké ọku ígwè ahu, puta, si, Genu nti olum, me ha, dika ihe nile si di nke M'nēnye unu n'iwu: unu ewe burum otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke:


Ọ buru na unu nāhum n'anya, unu gēdebe ihe nile M'nyere n'iwu.


Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya.


Ọ buru na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, unu gānọgide n'ihu-n'anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n'iwu, nọgide kwa n'ihu-n'anya-Ya.


Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n'iwu.


onye, mb͕e ọ biaruru, mb͕e ọ hu-kwa-ra amara Chineke, ọ ṅuria; o we riọ ha nile, ka ha zube n'obi-ha inọgide n'ebe Onye-nwe-ayi nọ:


Ma ub͕u a, Israel, gini ka Jehova, bú Chineke-gi, nāriọ n'aka-gi, ma-ọbughi itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ije ije n'uzọ-Ya nile, na ihu Ya n'anya, na iwere obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile fè Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè,


Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; Ya ka i gēfè, Ya ka i gārapara n'aru, aha-Ya ka i gēji ṅu iyi.


kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gārapara n'aru, dika unu meworo rue ta.


N'ihi na nka bu ihu-n'anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n'iwu: ihe O nyere n'iwu adighi kwa arọ́.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan