2 Ndị Eze 18:4 - Bible Nso4 Ya onwe-ya wezugara ebe nile di elu, titue ogidi nile, b͕utue Ashera: o tipia-kwa-ra agwọ ọla nke Moses mere; n'ihi na rue mb͕e ahu umu Israel nēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpọ ya Nehushtan. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a4 O wepụrụ ebe niile dị elu, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. O tipịakwara agwọ bronz ahụ Mosis mere, nʼihi na ruo nʼoge ahụ, ụmụ Izrel na-esure aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ya. (A kpọrọ ya Nehushtan.) Faic an caibideil |
Eze, bú Ehaz, we nye Uraija, bú onye-nchu-àjà, iwu, si, N'elu ebe-ichu-àjà uku ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku ututu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, na àjà-nsure-ọku nke eze, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, ha na àjà-nsure-ọku nke ndi nile nke ala nka, na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha; ọbara nile nke àjà-nsure-ọku, na ọbara nile nke àjà, n'elu ya ka i gāwusa kwa ya: ma ebe-ichu-àjà ọla ahu gādirim iji ju ase.
Ma mb͕e emere ka ihe a nile gwusia, Israel nile ndi ahuru n'ebe ahu puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe-ichu-àjà nile, me ka ha pua na Juda na Benjamin nile, n'Efraim kwa na Manase, rue mb͕e emere ka ha gwusia. Umu Israel nile we laghachi, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, rue obodo-ha.