Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 18:3 - Bible Nso

3 O me ihe ezi ziri n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna nna ya Devid.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 18:3
19 Iomraidhean Croise  

O gēru kwa, ọ buru na i nu ihe nile M'gēnye gi n'iwu, ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, me ihe ziri ezi n'anyam, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, dika Devid, bú orùm, mere; na M'gānọyere gi, wu-kwa-ra gi ulo kwesiri ntukwasi-obi, dika M'wuru Devid, M'gēnye kwa gi Israel.


O rue, na mb͕e agadi Solomon, na ndinyom-ya wezugara obi-ya ka o so chi ọzọ: obi-ya ezughi kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ya, nọ, dika obi Devid, bú nna-ya.


Esa mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika Devid, bú nna-ya, mere.


n'ihi na Devid mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, o sighi kwa n'ihe ọ bula O nyere ya n'iwu wezuga onwe-ya ubọchi nile nke ndu-ya, ọ bu nání n'okwu Uraia onye Het.


Ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu dika nna-gi, bú Devid, jere, M'gēme kwa ka ubọchi-gi di ogologo.


Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile.


O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, nání na o meghi dika Devid nna-ya; dika ihe nile si di nke Joash nna-ya mere, otú a ka o mere.


Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.


O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, je ije n'uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.


O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere.


Ọ nābù abù n'iru madu, si, Emehiewom, me kwa ihe ziri ezi ka ọ buru ajọ omume, Ma ọ baghm n'ihe:


N'ihi nka ka m'guworo ihe-iriba-ama-Gi nile, nke diri ihe nile, n'ihe ziri ezi; Uzọ okwu-ugha ọ bula ka m'kpọworo asì.


si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.


si, Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.


Ya mere iwu ahu di nsọ n'ezie, ihe enyere n'iwu di kwa nsọ, zi kwa ezi, buru kwa ezi ihe.


Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n'ihi na nka bu ihe ziri ezi.


Ma ub͕u a, Israel, gini ka Jehova, bú Chineke-gi, nāriọ n'aka-gi, ma-ọbughi itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ije ije n'uzọ-Ya nile, na ihu Ya n'anya, na iwere obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile fè Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè,


I gēme kwa ihe ziri ezi na nke di nma n'anya Jehova: ka o we diri gi nma, ka i we ba kwa, nweta ezi ala ahu, nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye ha,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan