Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 18:16 - Bible Nso

16 Na mb͕e ahu ka Hezekaia bipuru ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Jehova, na ogidi nile nke Hezekaia, bú eze Juda, jiri ọla-edo machita, o were ha nye eze Asiria.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Nʼoge ahụ, Hezekaya bụ eze Juda, nyakapụtachara ọlaedo niile o ji techie ibo na ibo ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, chịrị ihe ndị a niile nye eze Asịrịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 18:16
7 Iomraidhean Croise  

Jehoash, bú eze Juda, we chiri ihe nsọ nile nke Jehoshafat, na Jehoram, na Ehazaia, nna-ya-hà, bú ndi-eze Juda, doro nsọ, na ihe nsọ ya nile, na ọla-edo nile anāchọta n'àkù nile nke ulo Jehova, na nke ulo eze, zigara Hazael, bú eze Siria: o we si na Jerusalem rigo.


Ma okwu Joash nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?


Hezekaia we nye ya ọla-ọcha nile nke anāchọta n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze.


Eze Asiria we si na Lekish zie Tatan na Rab-saris na Rabshake jekuru eze, bú Hezekaia, ha na oké usu-ndi-agha, rue Jerusalem. Ha we rigo biarue Jerusalem. Ha we rigo, bia, guzo n'akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, nke di n'uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà.


Onye ahu, n'arọ mbu nke ọ bu eze, n'ọnwa mbu, o meghere uzọ ulo Jehova, me ka ha di ike.


Hezekaia we ṅuria ọṅu bayere ha, me ka ha hu ulo nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo nile nke ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n'àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n'ulo-ya, ma-ọbu n'ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan