Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 17:9 - Bible Nso

9 Umu Israel we were nzuzo me ihe nke nēzighi ezi megide Jehova, bú Chineke-ha, ha we wuere onwe-ha ebe di elu n'obodo-ha nile, site n'ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ndị Izrel mere ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị Chineke ha na-adịghị anabata na nzuzo. Ha wuru ebe ịchụ aja nye chi dị iche iche nʼobodo ha niile, e, nʼobodo ukwu ma nʼobodo nta ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 17:9
10 Iomraidhean Croise  

Ya onwe-ya tib͕uru ndi Filistia rue Geza na ókè-ala-ya nile, site n'ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike.


Ewe rafue obim na nzuzo, Akam we sutu ọnum ọnu:


Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe, Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo.


Ahuhu gādiri ndi nēzonari Jehova ndum-ọdu-ha n'ebe di omimi, ndi ọ bu kwa n'ọchichiri ka anālu ọlu nile ha, ha we si, Ònye nāhu ayi? ma-ọbu ònye mara ayi?


N'ihi na mb͕e M'mere ka ha ba n'ala ahu, nke M'weliri akam elu inye ha, ha we hu ugwu ntà nile ọ bula di elu, na osisi nile ọ bula b͕ara ọhia, ha we chua àjà nile ha n'ebe ahu, nye nkpasu-iwe nke onyinye-ibiaru-nso-ha n'ebe ahu, do ihe-ísì-utọ nile ha n'ebe ahu, wusi àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha n'ebe ahu.


O we sim, Nwa nke madu, ì huwo ihe ndi-okenye nke ulo Israel nēme n'ọchichiri, onye ọ bula n'ime-ulo nile nke ihe o mere ka ha yie ihe? n'ihi na ha nāsi, Ọ dighi Jehova nāhu ayi; Jehova arapuwo ala-ayi.


Ọ buru na Gilead bu ajọ ihe, nání ihe-efu ka ha ghọworo; nime Gilgal ha nāchu àjà oke-ehi di iche iche: e, ebe-ichu-àjà nile ha di ka obo-ihe n'ọ̀b͕à ubi.


Mb͕e nwa-nne-gi nwoke, bú nwa nke nne-gi, ma-ọbu nwa-gi nwoke, ma-ọbu nwa-gi nwayi, ma-ọbu nwunye nke obi-gi, ma-ọbu eyì-gi, nke di ka nkpuru-obi-gi, gārafu gi na nzuzo, si, Ka ayi je fè chi ọzọ, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha, gi onwe-gi, ma-ọbu nna-gi-hà;


Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēme arusi apiri api ma-ọbu arusi awuru awu, bu ihe-árú nke Jehova, ọlu aka nke onye nātu akika, we tiye ya n'ebe nzuzo. Ndi Israel nile gāza kwa, si, Amen.


Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, nke Ya na ha b͕ara mb͕e O mere ka ha si n'ala Ijipt puta;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan