Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 17:7 - Bible Nso

7 O rue, n'ihi na umu Israel mehiere megide Jehova, bú Chineke-ha, Onye nēme ka ha si n'ala Ijipt, si n'okpuru aka Fero, bú eze Ijipt, rigoputa, n'ihi na ha tu-kwa-ra egwu chi di iche iche ọzọ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ihe ndị a niile mere nʼihi na ndị Izrel mehiere megide Onyenwe anyị, bụ Chineke ha, onye ahụ mere ka ha site nʼokpuru ike Fero, eze Ijipt pụta. Ha kpọrọ isiala nye chi ndị ọzọ

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 17:7
27 Iomraidhean Croise  

O rue, na mb͕e agadi Solomon, na ndinyom-ya wezugara obi-ya ka o so chi ọzọ: obi-ya ezughi kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ya, nọ, dika obi Devid, bú nna-ya.


Ọ nējeghari na nmehie nile nke nna-ya, nke o buru ya uzọ me: obi-ya ezughi kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ya, nọ, dika obi Devid, bú nna-ya.


Orú arọ ka Ehaz b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: ma o meghi ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-ya, dika Devid nna-ya.


Jehova we soro ha b͕a ndu, nye ha iwu, si, Unu atula egwu chi di iche iche ọzọ, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu achu-kwara-la ha àjà:


Ha we mekpue emekpu megide Chineke nke ndi bu nna-ha, soro chi nile nke ndi ala ahu kwa iko, bú ndi Chineke kpochapuru n'iru ha.


Jehoiakim b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya.


Ma ha juru Gi aju, nupu isi megide Gi, tufue iwu-Gi n'azu ha, b͕ue ndi-amuma-Gi ndi b͕ara àmà megide ha ime ka ha chigharikute Gi, ha we me oké ihe-nlelì.


N'iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu, N'ala Ijipt, n'ọhia Zoan.


Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta.


unu ndi nēme onwe-unu ka unu di ọku n'etiti osisi terebinth, n'okpuru osisi ndu ọ bula; ndi nēb͕u umu-unu na ndagwurugwu nile n'okpuru nb͕awa nke nkume nile di elu?


Ha di ka nkwu, ihe akpuru akpu ka ha bu, ha adighi-ekwu okwu: aghaghi ibu ha ebu, n'ihi na ha adighi-azọ ije. Unu atula egwu ha; n'ihi na ha agaghi-eme ihe ọjọ, ọzọ kwa, ime izi ihe adighi ha n'aka.


Dika iru-árú-ha si di na dika njehie nile ha si di, otú a ka M'mere ha: M'we zonari ha irum.


Efraim akpasuwo iwe oké ilu: ọ bu kwa iwusi-ọbara-madu-ya ka Ọ gārapu n'aru ya, ọ bu kwa ita-uta-ya ka Onye-nwe-ya gēnyeghachi ya.


Ndim nāju ase n'aka osisi-ha, nkpa-n'aka-ha nēgosi kwa ha ihe: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile emewo ka ha kpafue, ha we pua n'okpuru Chineke-ha kwa iko.


N'elu ugwu nile ka ha nāchu àjà, n'elu ugwu ntà nile ka ha nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n'okpuru osisi oak na osisi poplar na osisi terebinth, n'ihi na ǹdò-ya di nma: n'ihi nka ka umu-unu ndinyom nākwa iko, ọ bu kwa n'ihi nka ka ndinyom unu luworo ọhu nākwa iko.


N'ihi na amawom na mb͕e ọnwum gasiri unu gēbibi onwe-unu nke-uku, wezuga onwe-unu n'uzọ ahu nke m'nyeworo unu n'iwu; ihe ọjọ gādakwasi kwa unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia; n'ihi na unu gēme ihe ọjọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe n'omume aka-unu.


Mb͕e unu gāgabiga ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, nke O nyere unu n'iwu, mb͕e unu gēje kwa fè chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha; iwe Jehova gādi kwa ọku n'aru unu, unu gālapu kwa n'iyì ngwa ngwa n'ezi ala ahu nke O nyeworo unu.


M'we si unu, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; unu atula egwu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma unu egeghi nti olum.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan