Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 17:21 - Bible Nso

21 N'ihi na Ọ dọwapuru Israel n'ulo Devid; ha we me Jeroboam nwa Nebat eze: Jeroboam we chuputa Israel n'iso Jehova, o we me ka ha mehie nmehie uku.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel dọwapụ onwe ha site nʼalaeze Devid, ha mere Jeroboam nwa Nebat, eze ha. Ma Jeroboam mere ka Izrel site nʼiso Onyenwe anyị wezuga onwe ha. O mere ka ha mee mmehie dị ukwuu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 17:21
19 Iomraidhean Croise  

Abimelek we kpọ Abraham, si ya, Gini bu ihe i meworo ayi? gini bu kwa ihe m'mehie-woro megide gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasim, biakwasi kwa ala-ezem? omume nke nēkwesighi ime ka imeworo m.


Jehova we si Solomon, N'ihi na nka di n'aka-gi, i we ghara idebe ọb͕ub͕a-ndum na ukpurum nile, nke M'nyeworo gi n'iwu, aghaghm idọwapu ala-eze n'aru gi, nye orù-gi.


Ọ si Jeroboam, Chiri n'onwe-gi ndọwa iri: n'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M'nādọwapu ala-eze a n'aka Solomon, M'gēnye kwa gi ebo iri:


Ihe a we ghọrọ ulo Jeroboam nmehie, ọbuná izopu ya, na ikpochapu ya n'elu uwa.


Ọ gārara kwa Israel nye n'ihi nmehie Jeroboam nile, nke o mehieworo, na nke o ji me ka Israel mehie.


we dowapu ala-eze n'ulo Devid, nye gi ya: ma i dighi ka orùm, bú Devid, onye debere ihe nile M'nyere n'iwu, o were obi-ya nile jesom, ime nání ihe ziri ezi n'anyam;


Umu Israel we jegharia nime nmehie nile nke Jeroboam, nke o mere; ha esighi nime ha wezuga onwe-ha;


Otú ọ di, ọ rapara na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie; o wezugaghi onwe-ya nime ya.


Ọ we me ka ebe nile ewusiri ike di ike, tiye ndi-ndú nime ha, na àkù, bú ihe-oriri, na manu, na manya-vine.


ọ we guzoro onwe-ya ndi-nchu-àjà idiri ebe di elu, na idiri nkpi, na idiri umu-ehi, nke o mere.


N'ihi aha-Gi, Jehova, B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne.


Moses we si Eron, Gini ka ndi nka mere gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasi ha?


Jehova gēme ka ubọchi biakwasi n'aru gi na n'aru ndi-gi, na n'aru ulo nna-gi, bú ubọchi nke nābiaghi site n'ubọchi Efraim wezugara onwe-ya n'aru Juda; ọbuná eze Asiria.


Jisus zara ya, si, I gaghi-enwe ike ọ bula imegidem, ọ buru na esighi n'elu nye gi ya-ri: n'ihi nka onye raram nye n'aka-gi nwere nmehie kari.


Nmehie umu-okorọbia ahu we di ukwu ri nne n'iru Jehova: n'ihi na ndikom ahu nēleli-onyinye-inata-iru-ọma nke Jehova.


É-è, umum; n'ihi na ọ dighi nma, bú akukọ nke mu onwem nānu: unu nēme ka ndi Jehova jehie.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan