Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 17:19 - Bible Nso

19 Juda edebeghi kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, kama ha jeghariri n'ukpuru nile nke Israel nke ha mere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ma ndị Juda jụkwara idebe ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke ha nyere ha nʼiwu. Ha sooro omume ọjọọ ndị Izrel webatara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 17:19
17 Iomraidhean Croise  

Ma o jere ije n'uzọ ndi-eze Israel. Ọzọ kwa, o mere ka nwa-ya nwoke gabiga nime ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


we jeghari n'ukpuru nile nke mba ọzọ, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel, na n'ukpuru ndi-eze Israel, nke ha mere.


O we rapara Jehova n'aru, o sighi n'iso Ya wezuga onwe-ya, o we debe ihe nile O nyere n'iwu, bú nke Jehova nyere Moses n'iwu.


M'gārapu kwa ndi fọduru nke ihe-nketam, nye ha n'aka ndi-iro-ha; ha gāghọ-kwa-ra ndi-iro-ha nile ihe-nluta-n'agha na ihe ha nānara n'ike;


Ọ je ije n'uzọ ndi-eze Israel, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ọ bu nwa-nwayi Ehab ka o nwere na nwunye: o we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


O we je ije n'uzọ ulo Ehab, me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ulo Ehab mere: n'ihi na nwa nwa ulo Ehab ka ọ bu.


kama ọ chọrọ Chineke nke nna-ya, jeghari kwa n'ihe nile O nyere n'iwu, ọ bughi kwa dika omume Israel si di.


Onye ahu me-kwa-ra ebe di elu n'ugwu nile nke Juda, we me ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, ọ rafu-kwa-ra Juda.


kama i jewo ije n'uzọ ndi-eze Israel, me Juda na ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, dika ulo Ehab mere ka akwa iko; ọzọ kwa, umu-nne-gi ndikom, bú ulo nna-gi, ndi di nma kari gi onwe-gi, ka i b͕uworo:


Ma òle ebe chi-gi nile nke i meworo nye onwe-gi nọ? ka ha bilie, ọ buru na ha gāzọputa gi na mb͕e ọnọdu ọjọ gi: n'ihi na dika ọnu-ọgugu obodo-gi nile si di, otú a ka chi-gi nile di, Juda.


N'uzọ nwa-nne-gi nwanyi ka i jeworo ije; M'gēwere kwa ìko-ya nye gi ṅ'aka.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Juda, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha juworo iwu Jehova, ọ bu kwa ukpuru-Ya nile ka ha nēdebeghi, okwu-ugha-ha nile, nke ndi bu nna-ha jeroso, we dufue ha:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan