Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 16:4 - Bible Nso

4 Ọ chua àjà, sure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu, na n'elu ugwu ntà nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ọ chụrụ aja surekwaa ihe nsure ọkụ aja na-esi isi ụtọ nʼebe niile dị elu, nʼelu ugwu niile, na nʼokpuru osisi ndụ ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 16:4
12 Iomraidhean Croise  

Ha onwe-ha we wu-kwa-ra onwe-ha ebe di elu, na ogidi, na Asherim, n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula;


Jehoash we si ndi-nchu-àjà, Ego nile nke ihe nsọ nile nke anēwebata n'ulo Jehova, bú ego onye nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, nwoke ọ bula ego madu nile nke ọ̀rùrù-ọnu-ya, na ego nile nke ọ batara n'obi nwoke ọ bula iwebata n'ulo Jehova,


Nání na ewzugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu.


Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe, Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo.


ndi nānọdu n'etiti ílì, nānọ kwa ọnọdu-abali n'ebe nile echebeworo na nzuzo; ndi nēri anu ezì, ofé nke ihe-árú di iche iche di kwa n'ihe-isi-ite nile ha;


Ndi nēdo onwe-ha nsọ ndi nēme onwe-ha ka ha di ọcha ibà n'ubi nile ab͕ara ogige, n'azu otù onye di n'etiti, ndi nēri anu ezì, na ihe-árú ahu, na òké; n'otù ka ha gāgwusi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ebe umu-ha nēcheta ebe-ichu-aja nile ha na Asherim-ha n'akuku osisi ndu n'elu ugwu ntà ha nile di elu.


O we sim, Nwa nke madu, nka bu ebe nke oche-ezem, na ebe nke ọbu-ukwu nke ukwum abua, ebe M'gēbi n'etiti umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: ulo Israel agaghi-emeru kwa aha nsọm ọzọ, ha onwe-ha, ma-ọbu ndi-eze-ha, site n'ikwa-iko-ha, na site n'ozu nile nke ndi-eze-ha n'ebe di elu ha;


Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e ndi-ha eb͕uru eb͕u di n'etiti arusi nile ha buruburu ebe-ichu-àjà nile ha, n'ugwu ntà ọ bula di elu, na n'elu ugwu nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, na n'okpuru osisi terebinth ọ bula b͕ara ọhia, bú ebe ha nyere arusi nile ha ihe ísì utọ.


Unu aghaghi ime ka ebe ahu nile la n'iyì, bú ebe mba nile unu nēnweta fère chi nile ha òfùfè, n'elu ugwu nile ha di elu, na n'elu ugwu ntà nile ha, na n'okpuru osisi ndu ọ bula:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan