Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 16:2 - Bible Nso

2 Orú arọ ka Ehaz b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: ma o meghi ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-ya, dika Devid nna-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ehaz gbara iri afọ abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Afọ iri na isii ka ọ chịkwara nʼime Jerusalem, ma o meghị ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke ya, dịka nna ya Devid mere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 16:2
14 Iomraidhean Croise  

Ọ nējeghari na nmehie nile nke nna-ya, nke o buru ya uzọ me: obi-ya ezughi kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ya, nọ, dika obi Devid, bú nna-ya.


Ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu dika nna-gi, bú Devid, jere, M'gēme kwa ka ubọchi-gi di ogologo.


Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n'irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, n'izu-okè nke obi, na n'izi-ezi, ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile;


O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, nání na o meghi dika Devid nna-ya; dika ihe nile si di nke Joash nna-ya mere, otú a ka o mere.


O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Amazaia nna-ya mere.


O me ihe ziri ezi n'anya Jehova: dika ihe nile si di nke Uzaia nna-ya mere, otú a ka o mere.


O rue, n'arọ nke-atọ nke Hoshea nwa Ila, bú eze Israel, na Hezekaia nwa Ehaz, bú eze Juda, malitere ibu eze.


O me ihe ezi ziri n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere.


O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, je ije n'uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.


Jehova we nọyere Jehoshafat, n'ihi na o jere ije n'uzọ mbu Devid, bú nna-ya, ọ chọghi kwa Bealim;


O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan