Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 16:12 - Bible Nso

12 Eze we si na Damaskọs bia, eze we hu ebe-ichu-àjà ahu: eze we biarue ebe-ichu-àjà ahu nso, sure àjà-nsure-ọku n'elu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mgbe eze si Damaskọs lọta na Juda, ọ hụrụ ebe ịchụ aja ahụ, bịaruo ya nso, doo onyinye ịchụ aja ya nʼelu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 16:12
8 Iomraidhean Croise  

Ọ rigorue ebe-ichu-àjà nke o mere na Bet-el n'ubọchi nke-iri-na-ise n'ọnwa nke-asatọ, bú n'ọnwa nke ọ chèputara n'obi-ya: o we mere umu Israel ememe, rigorue ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Ma, le, onye nke Chineke siri na Juda bia n'okwu Jehova rue Bet-el: ma Jeroboam nēguzo n'akuku ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Uraija, bú onye-nchu-àjà, we wue ebe-ichu-àjà ahu: dika ihe nile si di nke eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs zite, otú a ka Uraija, bú onye-nchu-àjà, mere, rue mb͕e eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs bia.


Ọ we sure àjà-nsure-ọku-ya ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, sure kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, wusi kwa àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, wusa kwa ọbara àjà-udo-ya nile, n'elu ebe-ichu-àjà ahu.


O we chuara chi nile nke Damaskọs àjà, bú ndi tib͕uru ya: ọ si, N'ihi na chi nke ndi-eze Siria nēyere ha aka, ndi ahu ka m'gāchuru àjà, ka ha we yerem aka. Ma chi ahu buru ya, bu-kwa-ra Isarel nile, ihe mere ka ọ su ngọngọ.


N'obodo nile ọ bula nke Juda ka o me-kwa-ra ebe di elu isurere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, o we kpasue Jehova, bú Chineke nke nna-ya-hà, iwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan