Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 15:32 - Bible Nso

32 N'arọ nke-abua nke Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, ka Jotam nwa Uzaia, bú eze Juda, malitere ibu eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị Peka nwa Remalaya eze Izrel ka Jotam nwa Ụzaya eze Juda malitere ọchịchị ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 15:32
17 Iomraidhean Croise  

Ndi nile nke Juda we were Azaraia, ma onye ahu b͕ara arọ iri na isi, ha we me ya eze n'ọnọdu nna-ya Amazaia.


N'arọ nke-orú-na-asa nke Jeroboam, bú eze Israel, ka Azaraia nwa Amazaia, bú eze Juda, malitere ibu eze.


Shalum nwa Jebesh malitere ibu eze n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Uzaia, bú eze Juda; o we buru eze ogologo otù ọnwa nime Sameria.


N'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Azaraia, bú eze Juda, ka Menahem nwa Gadi malitere ibu eze Israel arọ iri nime Sameria.


N'arọ nke-ọgu-abua-na-iri nke Azaraia, bú eze Juda, ka Pekahaia nwa Menahem malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ abua.


N'arọ nke-ọgu-abua-na-iri-na-abua nke Azaraia, bú eze Juda, ka Peka nwa Remalaia malitere ibu eze Israel nime Sameria orú arọ.


Hoshea nwa Ila we kekọta nkekọta-madu megide Peka nwa Remalaia, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya, n'arọ nke-orú nke Jotam nwa Uzaia.


Ma okwu Peka nile nke fọduru, na ihe nile o mere, le, edewo ha n'akwukwọ, ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.


Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jerusha nwa-nwayi Zedok.


Jehova we tie eze ahu ihe, o we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche. Ma Jotam nwa eze bu onye-isi ulo-ya, nēkpe ndi ala ahu ikpe.


Azaraia we so nna-ya-ha dina n'ọnwu; ha we lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Jotam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.


Amazaia nwa-ya, Azaraia nwa-ya, Jotam nwa-ya;


Edere ha nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu n'ubọchi Jotam, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam, bú eze Israel.


Ọhù Aisaia nwa Emoz, nke ọ huru bayere Juda na Jerusalem n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda.


Okwu Jehova nke ruru Maika, bú onye Moreshet, nti, n'ubọchi Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, bú okwu nke ọ huru bayere Sameria na Jerusalem.


Uzaia we mua Jotam; Jotam we mua Ehaz; Ehaz we mua Hezekaia;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan