Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 15:14 - Bible Nso

14 Menahem nwa Gadi we si na Tiaza rigo, biarue Sameria, tib͕ue Shalum nwa Jebesh nime Sameria, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Menahem nwa Gadi sitere nʼobodo Tịaza bịaruo Sameria gbuo Shalum nwa Jebesh ghọọ eze nʼọnọdụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 15:14
9 Iomraidhean Croise  

Nwunye Jeroboam we bilie, la, biarue Tiaza: mb͕e nwayi ahu nābata na nbata-uzọ ulo, nwa-okoro ahu we nwua.


O rue, mb͕e Beasha nuru ya, na ọ rapuru iwu Rema, we biri na Tiaza.


N'arọ nke-atọ nke Esa, bú eze Juda, ka Beasha, bú nwa Ahaija, malitere ibu eze Israel nile nime Tiaza, orú arọ na anọ.


N'arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, ka Zimri bu eze ubọchi asa na Tiaza. Ma ndi Israel nọ n'ọmuma-ulo-ikwū imegide Gibeton, nke diri ndi Filistia.


Ọmri we si na Gibeton rigo, ya na Israel nile, ha we nọchigide Tiaza n'agha.


Shalum nwa Jedesh we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya n'iru ndi Israel, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya.


Ma ihe nile Shalum mere nke fọduru, na nkekọta-ya nke ọ kekọtara madu imegide eze, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.


N'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Azaraia, bú eze Juda, ka Menahem nwa Gadi malitere ibu eze Israel arọ iri nime Sameria.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan