Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 14:9 - Bible Nso

9 Jehoash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ma Jehoash eze Izrel zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda sị ya, “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi, sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ, zọpịa uke ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 14:9
15 Iomraidhean Croise  

O kwu-kwa-ra okwu bayere osisi, site na cedar nke di na Lebanon we rue hyssop nke nēpuputa na mb͕idi: o kwu-kwa-ra okwu bayere anu, baye-kwa-ra anu-ufe, baye-kwa-ra ihe nākpu akpu, baye-kwa-ra azù.


Joash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu.


Jehova we me ka ndi-isi usu-ndi-agha nke eze Asiria nwere biakwasi ha, ha we jide Manase n'ọhia-ogwu, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, me ka o jerue Babilon.


(Kama site na mb͕e m'di na nwata o tozuru n'akam dika n'aka nna-ya, Ọ bu kwa site n'afọ nnem ka m'buru nwayi di-ya nwuru onye-ndú;)


Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya n'ire ọku site n'etiti osisi ntà: o we hu, ma, le, osisi ntà ahu nēre ọku, ma erepiaghi osisi ntà ahu.


Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè, Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di.


Dika urodi n'etiti ogwu, Otú a ka eyìm di n'etiti umu-ndinyom.


Ogwu gēpú kwa n'ulo-elu-ya nile, akuba na ọhia-ogwu n'ebe-ya nile ewusiri ike: o we ghọ ebe-obibi nkita-ọhia, ogige nke diri enyi-nnunu.


M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ha nēkwu okwu bayerem, si, Ọ̀ bughi onye nātu ilu ilu ka ọ bu?


N'ihi na, le, ha esiwo na nbibi la, ma Ijipt gāchikọta ha, Memfis gēlì ha: ihe ọla-ọcha ha anāchọsi ike, akuba gēnweta ha: ogwu gādi n'ulo-ikwū nile ha.


Ọ buru na ukwu gāsi, N'ihi na abughi m aka, abughi m nke aru; ọ bughi ihe nābughi nke aru n'ihi nka.


Ndikom Israel we hu na nkpà nākpà ha, (n'ihi na anāchi Israel n'ihe-ike), ndi Israel we zo onwe-ha n'ọb͕à, na n'ọhia-ogwu, na nime nkume di elu, na n'ulo-elu, na n'olùlù.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan