Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 14:16 - Bible Nso

16 Jehoash we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya nime Sameria n'ebe elìri ndi-eze Israel; Jeroboam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Jehoash sooro nna nna ya ha dinaa nʼọnwụ, e lie ya na Sameria, ebe e liri eze ndị Izrel ndị ọzọ. Jeroboam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 14:16
13 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ubọchi-gi zuru, mb͕e gi gēsoro nna-gi-hà dina kwa n'ọnwu, M'gēme kwa ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, nke gēsi n'afọ-gi puta, M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.


Ma emeghi otú a, o gēru kwa, mb͕e onye-nwem, bú eze, soro nna-ya-hà dina n'ọnwu, na agāgu mu onwem na nwam, bú Solomon, na ndi-nmehie.


Ma okwu Joash nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya nke o jiri buso Amazaia, bú eze Juda, agha, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?


Joash we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Jeroboam we nọkwasi n'oche-eze-ya: ewe lìe Joash nime Sameria n'ebe elìri ndi-eze Israel.


Jehoahaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya na Sameria: Joash nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.


Ma ihe Jehoash nile nke fọduru, nke o mere, na idi-ike-ya, na otú o busoro Amazaia, bú eze Juda, agha èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?


Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, we di ndu mb͕e ọnwu Jehoash nwa Jehoahaz, bú eze Israel, gasiri, arọ iri na ise.


N'aro nke-iri-na-ise nke Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, ka Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, malitere ibu eze na Sameria ọgu arọ abua na otù.


Ma okwu Jeroboam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya, otú o buru agha, otú o weghachi-kwa-ra Damaskọs, na Hemat, nke Juda nwere, nye Israel, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?


Edere ha nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu n'ubọchi Jotam, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam, bú eze Israel.


Okwu Jehova nke ruru Hosea nwa Beeri nti n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel.


Okwu Emos, onye nọ n'etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan