Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 13:7 - Bible Nso

7 N'ihi na ọ kweghi ka ndi Israel ọ bula fọduru Jehoahaz, ọ bu nání ọgu ndi-inyinya abua na iri, na ub͕ọ-ala iri, na orú nnù ndikom na nnù ise ndi ji ukwu eje; n'ihi na eze Siria mere ka ha la n'iyì, me kwa ha ka ha di ka ájá izọkwasi ukwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ọ dịghị ihe fọdụrụ na ndị agha Jehoahaz ma ọ bụghị naanị iri ndị agha ise na-agba ịnyịnya, na ụgbọ agha iri, na puku ndị agha iri. Nʼihi na eze Aram alaala ndị nke fọdụrụ nʼiyi, meekwa ka ha dịrị ka uzuzu mgbe a na-azọcha mkpụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 13:7
17 Iomraidhean Croise  

Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala, Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha.


O we gukọta umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, ha we di ọgu iri-na-otù na iri na abua: mb͕e agukọtasiri ha ọ gukọta ndi-ya nile, bú umu Israel nile, nnù iri-na-asa na ọgu iri.


Agukọta-kwa-ra umu Israel, nye ha ihe-oriri, ha we je izute ha: umu Israel we ma ulo-ikwū-ha n'iru ha dika ìgwè ewu ntà abua; ma ndi Siria juputara ala.


Na mb͕e ahu ka Jehova malitere ibipu ufọdu n'Israel: Hazael we tib͕ue ha n'ókè ala nile nke Israel;


Ma okwu Jehoahaz nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ nke ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?


Hazael we si, Gini mere onye-nwem nākwa ákwá? Ọ si, N'ihi na amawom ihe ọjọ nke i gēme umu Israel: i gēsu ebe nile ha ewusiri ike ọku, i gēwere kwa mma-agha b͕ue umu-okorobia-ha, i gātupia kwa umu-ha nāṅu ara, i gāb͕awa ndinyom-ha di ime afọ.


Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe: Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.


Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m'nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha.


Ònye kpọteworo otù onye site n'ọwuwa-anyanwu, onye Ọ kpọrọ n'ezi-omume ibiarute ukwu-Ya? Ọ nēwere mba di iche iche nye n'iru ya, Ọ nēme kwa ya ka ọ nwe ike n'aru ndi-eze: O nēwere ha nye mma-agha-ya dika ájá, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke anēfepu efepu, otú a ka Ọ nēwere ha nye uta-ya.


Ọtutu ìgwè madu, ọtutu ìgwè madu nime ndagwurugwu nkpebì-ikpe! n'ihi na ubọchi Jehova di nso nime ndagwurugwu nkpebì-ikpe.


M'gēche irum imegide unu, agētib͕u kwa unu n'iru ndi-iro-unu: ndi nākpọ unu asì gāzọda unu; unu gāb͕alaga kwa mb͕e ọ nādighi onye nāchu unu.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Damaskọs, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha ewerewo ígwè eji azọcha ọka zọcha Gilead:


Ezitewom ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu n'uzọ o si eme n'Ijipt: eb͕uwom umu-okorọbia-unu na mma-agha, ha na inyinya nile unu adọtara n'agha; M'we me ka ísì ọjọ nke ọmuma-ulo-ikwū-unu rigota ọbuná n'imi-unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Samuel we bilie, si na Gilgal rigorue Gibea Benjamin. Sọl we gukota ndi Israel, bú ndi ahutara n'aka-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan