Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 13:5 - Bible Nso

5 (Jehova we nye Israel onye-nzọputa, ha we pua n'okpuru aka Siria: umu Israel we biri n'ulo-ikwū-ha, dika na mb͕e gara aga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Onyenwe anyị họpụtaara Izrel onye nzọpụta, ha sitere nʼaka ike ndị Aram nwere onwe ha. Izrel biri nʼụlọ nke aka ha dịka ha biiri nʼoge gara aga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 13:5
13 Iomraidhean Croise  

Jehoash nwa Jehoahaz we naghachi n'aka Ben-hedad nwa Hazael obodo nile nke ọ nara n'aka Jehoahaz nna-ya n'agha. Ub͕ò atọ ka Joash tib͕uru ya, we weghachi obodo nile nke Israel.


Onye ahu weghachiri ókè-ala Israel site na nbata Hemat rue oké osimiri Araba, dika okwu Jehova, bú Chineke Israel, si di, nke O kwuru site n'aka Jona nwa Amitai, bú onye-amuma, nke sitere na Gat-hefa.


Ma Jehova ekwughi na Ọ gēhichapu aha Israel n'okpuru elu-igwe: O we si n'aka Jeroboam nwa Joash zọputa ha.


Na mb͕e gara aga, ọbuná mb͕e Sọl bu eze, gi onwe-gi bu onye nēdupu na onye nēdubata Israel: Jehova, bú Chineke-gi, we si gi, Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel, gi onwe-gi gābu kwa onye-ndú ndim, bú Israel.


I we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we kpab͕ue ha: ma na mb͕e nkpab͕u-ha, ha we tikue Gi, Gi onwe-gi we site n'elu-igwe nu, nye ha ndi-nzọputa dika ọtutu obi-ebere-Gi nile si di, ha we zọputa ha n'aka ndi nākpab͕u ha.


N'ihi na ọ buru na i b͕a nkiti ghara ikwu okwu ọ bula na mb͕e a, oghere na nnaputa gēguzoro ndi-Ju site n'ebe ọzọ, ma agēme ka gi onwe-gi na ulo nna-gi la n'iyì: ma ònye mara ma ọ bu n'ihi mb͕e di otú a ka i biaruru ala-eze?


Moses we si Jehova, Biko, Onye-nwe-ayi, Ọ bughi onye-ọ̀kà-okwu ka m'bu, ma-ọbu na mb͕e gara aga, ma-ọbu site na mb͕e I gwara orù-Gi okwu: n'ihi na onye ọnu-ya di arọ́, nke ire-ya di kwa arọ́, ka m'bu.


Ọ gābu-kwa-ra Jehova nke usu nile nke ndi-agha ihe-iriba-ama na ihe-àmà n'ala Ijipt: n'ihi na ha gētiku Jehova n'ihi ndi-nmeb͕u, O gēzite-kwa-ra ha onye-nzọputa na onye gāluru ha ọ̀gù, O we naputa ha.


Ndi-nzọputa gārigota kwa n'ugwu Zaion ikpe ugwu Isọ ikpe; ọ bu kwa Jehova gēnwe ala-eze ahu.


n'ihi na ta n'obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bu Kraist Onye-nwe-ayi.


Nka bu kwa okwu bayere ob͕u-madu, nke gāb͕alaga n'ebe ahu, we di ndu: onye nēb͕u madu-ibe-ya n'amaghi-ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga;


Jehova we zite Jerubeal, na Bedan, na Jefta, na Samuel, we naputa unu n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi.


Jonatan we kpọ Devid, Jonatan we gosi ya ihe ndia nile. Jonatan we me ka Devid biakute Sọl, o we nọ n'iru ya, dika na mb͕e gara aga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan