Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 13:10 - Bible Nso

10 N'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke Joash, bú eze Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ibu eze Israel; nime Sameria arọ iri na isi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Nʼafọ iri atọ na asaa nke ịbụ eze Joash na Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ị bụ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị afọ iri na isii.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 13:10
8 Iomraidhean Croise  

Jehova we si Jihu, N'ihi na i mewo nke-ọma n'ime ihe ziri ezi n'anyam, i we me ulo Ehab dika ihe nile si di nke di n'obim, umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel.


N'arọ nke-asa nke Jihu ka Jehoash malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba.


N'arọ nke-orú-na-atọ nke Jọash nwa Ehazaia, bú eze Juda, ka Jehoahaz nwa Jihu malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ iri na asa.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, bú nke o jiri me ka Israel mehie, wezuga onwe-ya: kama o jeghariri nime ya.


Jehoahaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya na Sameria: Joash nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.


N'arọ nke-abua nke Joash nwa Joahaz, bú eze Israel, ka Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, malitere ibu eze.


Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, we di ndu mb͕e ọnwu Jehoash nwa Jehoahaz, bú eze Israel, gasiri, arọ iri na ise.


Nka bu okwu Jehova, nke Ọ gwara Jihu, si, Umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel. O we di otú a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan