Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 13:1 - Bible Nso

1 N'arọ nke-orú-na-atọ nke Jọash nwa Ehazaia, bú eze Juda, ka Jehoahaz nwa Jihu malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ iri na asa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash nwa Ahazaya na Juda, ka Jehoahaz nwa Jehu malitere ịbụ eze nʼIzrel nʼobodo Sameria. Ọ chịkwara na Sameria afọ iri na asaa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 13:1
10 Iomraidhean Croise  

Jehova we si Jihu, N'ihi na i mewo nke-ọma n'ime ihe ziri ezi n'anyam, i we me ulo Ehab dika ihe nile si di nke di n'obim, umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel.


Jehoash b͕ara arọ asa mb͕e ọ malitere ibu eze.


Ma n'arọ nke-asa Jehoiada zigara chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi diri ndi-Karait, na ndi diri ndi-ọb͕a-ọsọ, o me ka ha bakute ya n'ulo Jehova; ya na ha we b͕a ndu, o me ka ha ṅua iyi n'ulo Jehova, o me kwa ka ha hu nwa eze.


N'arọ nke-asa nke Jihu ka Jehoash malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba.


N'ihi na Jozaka nwa Shimeat, na Jehozabad nwa Shomea, bú ndi-orù-ya, tib͕uru ya, o we nwua; ha we lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Amazaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.


N'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke Joash, bú eze Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ibu eze Israel; nime Sameria arọ iri na isi.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, jeso nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie; o sighi nime ya wezuga onwe-ya.


Nka bu okwu Jehova, nke Ọ gwara Jihu, si, Umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel. O we di otú a.


Orú arọ na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem. Ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri, bú eze Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan