Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 12:9 - Bible Nso

9 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we were otù ib͕e, rapúe oghere n'okwu-ya, dọba ya n'akuku ebe-ichu-àjà, n'aka-nri nke ebe madu nābà n'ulo Jehova: ndi-nchu-àjà ndi nēche nbata-uzọ we tiye n'ebe ahu ego nile anēwebata n'ulo Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mgbe ahụ, Jehoiada wetara otu igbe mepuo oghere nʼelu ya, debe ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja, nʼaka nri dịka mmadụ na-abata nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ndị nchụaja niile na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ na-etinye ego niile e webatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼime igbe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 12:9
12 Iomraidhean Croise  

Ndi-nchu-àjà we kwere ka ha ghara inara ego n'aka ndi Juda, ka ha ghara kwa ime ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.


Rigokuru Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, ka o we guzù ego ahu nke anēwebata n'ulo Jehova, nke ndi nēche nbata-uzọ chikọtaworo n'aka ndi Israel:


Eze we nye Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nke usoro nke-abua, na ndi nēche nbata-uzọ, iwu, isi n'ulo Jehova weputa ihe nile nke emeworo nye Beal, nye kwa Ashera, nye kwa usu nile nke ihe elu-igwe: o we sure ha ọku n'azu Jerusalem n'ọhia Kidron, būru ntu-ha je Bet-el.


Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:


tiye-kwa-ra ha umu-nne-ha, bú ndi nke usoro nke-abua, Zekaraia, na Ben, na Jaaziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Benaia, na Maaseia, na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, bú ndi-ọnu-uzọ-ama.


Shebania, na Joshafat, na Netanel, na Amasai, na Zekaraia, na Benaia, na Elieza, bú ndi-nchu-àjà, nāfù opì n'iru ib͕e Chineke: Obed-edom na Jehia bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.


N'ihi na otù ubọchi n'ogige-Gi nile di nma kari nnù ubọchi abua na ọgu iri n'ebe ọzọ. Arọputawom iguzo na nbata-uzọ n'ulo Chinekem, Kari ibi n'ulo-ikwū nile nke nmebi-iwu.


m'we me ka ha bata n'ulo Jehova, n'ime-ulo umu Henan nwa Igdalaia, bú onye nke Chineke, nke di n'akuku ime-ulo ndi-isi, nke di n'elu ime-ulo Maaseia nwa Shalum, bú onye-nche nke nbata-uzọ:


Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:


O we nọdu n'ulo uku Chineke na ncherita-iru ebe anēdebe ùtú anātu, O we nēle otú ìgwè madu nātubà ego n'ebe ùtú ahu: ọtutu ndi bu ọgaranya nātubà kwa ri nne.


O we le anya n'elu, hu ndi-ọgaranya ka ha nātubà onyinye-ha n'ebe anēdebe ùtú anātu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan